Atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Annual Plan and the translation is 100% complete.

'atụmatụ afọWikimedia Foundation bụ atụmatụ ndekọ maka ọrụ Wikimedia Foundation kwa afọ. Emebere ihe ndị a maka afọ mmefu ego nke Wikimedia Foundation, nke na-amalite na ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị wee kwụsị na ụbọchị iri atọ nke ọnwa Juun nke afọ na-abịa. Enwere ike ịkpọ imepụta atụmatụ a mgbe ụfọdụ dị ka Usoro atụmatụ Kwa Afọ ma ọ bụ APP.

De Groene Verbinding
De Groene Verbinding

Ndepụta atụmatụ afọ

Ajụjụ ndị a na-ajụkaarị (FAQ)

  1. Gịnị bụ atụmatụ kwa afọ?
    Atụmatụ kwa afọ bụ ntuziaka dị elu nke ihe otu na-ezube inweta n'afọ na-abịanụ. Ha na-egosipụtakarị ihe ndị dị mkpa, mkpa aga eleba anya, na mpụtaara achọrọ nke e kepụtarakọrọ na Wikimedia Movement, ma daba n'usoro buru ibu nke ntinye uchu ọtụtụ afọ anyị na usoro ntụziaka atụmatụ nke Njem Wikimedia.
    Na Wikimedia Foundation, atụmatụ a na-eme kwa afọ bụ inye ndị njikwa na ndị otu ntuziaka site na ịchịkọba ọrụ niile ha rụrụ n'afọ. Ebumnuche ya abụghị ka ọ bụrụ ndepụta nke ọrụ teknụzụ, dịka ndị a na-agbanwe n'afọ niile. Atụmatụ kwa afọ nwere ihe ndị dị mkpa na echiche dị elu nke na-eduzi ndị otu inyocha, imepụta, ịnwale, ma itinye usoro atụmatụ dị iche iche. Ndị na-ege ntị bụ isi na atụmatụ kwa afọ bụ ngalaba dị n'ime otu, otu, na ndị ọrụ n'otu n'otu na-eji ya eduzi ọrụ ha n'afọ niile, nke a na-egosipụta na ụdaolu, asụsụ, na nhazi atụmatụ ahụ. A na-emebe ya site na mmekorita ma mee ka ọha na eze hụ ya kwa afọ na mbụ n'ụdị ederede wee bụrụ ngwaahịa ikpeazụ iji nye ezi mkpughe ma rịọ inwe nzaghachi site n'aka ndị Wikimedia.
  2. Kedu akụkụ bụ isi nke atụmatụ afọ?
    Malite n'afọ mmefu ego 2023-2024, Foundation malitere ibipụta ngalaba anọ ndị ahọpụtara ebe anọ dị mkpa gbanyere mkpọrọgwụ na usoro ntụziaka atụmatụ bụ: Akụrụngwa, Ịha nhatanha, Nchekwa na Ikwudosike n'ezi ihe &amp, na Ịrụ ma ọrụ. Atụmatụ kwa afọ na-agụnyekarị ozi gbasara nnukwu ihe ndị n'ewu ewu na mpụga nke nwere ike imetụta ọrụ anyị, yana ntinye aka anyị, ọrụ ngalaba, mmefu ego, inye onyinye ego ọrụ, na usoro nnweta ego.
  3. Gịnị mere Foundation ji nwee atụmatụ kwa afọ?
    Atụmatụ kwa afọ na-enyere Wikimedia Foundation aka ijikọ ọrụ ndị ọrụ na-eme kwa ụbọchị na ebumnuche anyị na nlekwasa anya buru ibu, ihe ụwa chọrọ n'aka anyị, yana usoro ntụziaka atụmatụ Wikimedia. Ọ bụ oge mgbe ndị isi Foundation na-atụle ihe ndị na-asọmpi otu ndị otu ha kwesịrị isi rụọ ọrụ n'afọ na-abịanụ, ma hụ na anyị na-egbo mkpa dị mgbagwoju anya na nke na-eme mgbanwe nke ndị na-ọgụụ, ndị na-ntinye aka, ndị na-enye onyinye na ikpo okwu anyị. Ọ na-enyekwa ndị ọrụ na Foundation ohere iji chọpụta ihe ndị a dị mkpa ma melite ụzọ dị mma any na ndị ọrụ afọ ofufo iji rụkọọ ọrụ, ndị mmekọ, Board of Trustees, na ibe ha gburugburu otu na ngalaba.
  4. Gịnị bụ oge nke atụmatụ kwa afọ?
    Wikimedia Foundation na-agbaso kalenda usro mmefu ego July-June. Nke a pụtara na afọ mmefu ego (FY) 2024-2025 malitere July 2024 ruo June 2025. N'ime afọ ahụ, anyị na-eso ntule ọrụ anyị n'ime nkebi ụzọ anọ, nke ọ bụla n'ime ọnwa atọ.
  5. Olee otú e si dee atụmatụ kwa afọ?
    Usoro a na-agbanwe site n'afọ ruo n'afọ, mana n'ime afọ ole na ole gara aga, anyị anọgidewo na-akwalite ma na-emeziwanye usoro atụmatụ mmekọrịta.
    Mkparịtaụka maka FY 2024-2025 malitere na Talking:2024 - mkparịtaụka n'etiti ndị ọrụ Foundation, ndị isi, ndị otu bọọdụ, na ndị Wikimedians gburugburu ụwa. Nzaghachi sitere na mkparịtaụka ndị a mere ka a mata ihe ndị dị mkpa e debere n'okpuru ebumnuche nke atụmatụ afọ. Talking: 2024 bụ akwụkwọ ịkpọ òkù sochiri ya sitere n'aka Onye isi ngwaahịa na teknụzụ bụ Selena Deckelmann maka ntinye na-wiki n'ime ebumnobi atụmatụ maka ọrụ ngwaahịa na teknụzụ nke Foundation n'afọ na-abịa. Ebumnobi ndị a bụ nke mkparịtaụka na-aga n'ihu site na Talking:2024na-ewulite, nke gosipụtara mkpa ọ dị ịnọgide na-elekwasị anya na mkpa nke ikpo okwu anyị na ndị ntinye aka n'ịntanetị. E bipụtara mpụtaara dị mkpa nke Ngwaahịa na Teknụzụ na ngwụcha Machị, ihe ndị sochiri bụ akwụkwọ atụmatụ kwa afọ zuru ezu na 11 Eprel 2024.
    Anyị na-anabata echiche gị ugbu a site na 31st May 2024 ma a ga-emelite ibe a dị ka mkparịtaụka ọhụrụ na wiki na mkparịtaụka na ọwa na asụsụ dị iche iche. Mkparịtaụka ndị a bụ ebe ndị Wikimedia na-ekwupụta echiche ha banyere atụmatụ ndị a tụrụ aro ma na-ekwuuta ebumnobi nke ha maka afọ na-abịanụ. N'ịbụ ndị ihe ọtụtụ ndị ọzọ na-eme n'ọrụ nke ha kpaliri, anyị na-aga n'ihu na-achọta ohere iji rụkọọ ọrụ ma mụta ihe site na usoro atụmatụ na ọrụ nke ndị ọzọ na Njem Wikimedia yana ndị mmekọ ndị ọzọ. N'afọ a, enwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi tinye aka: ebe a na Meta-Wiki, na oghere ngalaba otu dị icheiche kepụtara, na ibe ọrụ Wikimedia, na ọwa ndị ngalaba.
  6. Gịnị na-awọwapụta ihe na-abanye na atụmatụ kwa afọ?
    E nwere ọtụtụ ihe na-akọwa ihe na-abanye na atụmatụ kwa afọ nke Wikimedia Foundation. Anyị na-amalite site n'iche echiche banyere "gịnị ka ụwa chọrọ anyị"? Nke a pụtara ile anya n'ihe ndị na-eme n'ụwa niile, dị ka ịrị elu nke ozi na-ezighi ezi na ozi na-ezighị ezi, ọgụgụ isi aka mere, mgbanwe na usoro ọchụchọ, na mgbanwe nchịkwa ụwa.
    Ihe ọzọ anyị na-eche banyere ya bụ "gịnị ka ndị na-ege anyị ntị chọrọ n'aka anyị?" Na ọkwa dị mfe, ndị na-ege anyị ntị gụnyere ndị na-enye aka, ndị na'agụ akwụkwọ na ndị ọzọ na-eji ọdịnaya anyị eme ihe, na ndị na-enye anyị onyinye. Ndị bụ ndị na-enye aka anyị na-ekwu bụ, onye ọ bụla na-etinye oge ya iji zụlite ma ọ bụ melite ọdịnaya na ọrụ Wikimedia gụnyere ndị ndezi (nke ọkwa ahụmịhe niile), ndị na-enwere ọdịnaya, na ndị mmepe afọ ofufo. Ụdị nke abụọ gụnyere onye ọ bụla site na ndị na-agụ akwụkwọ n'otu n'otu ruo ndị na-eme nchọpụta agụmakwụkwọ ruo nnukwu ụlọ ọrụ na-ewere ma na-eji ọdịnaya Wikimedia eme ihe ọzọ. anyị sị ndị na-enye onyinye, anyị na-ekwu maka onye ọ bụla na-enye nkwado ego nke nha ọ bụla na usoro ọ bụla. Anyị na-atụgharị uche n'ihe anyị na-anụta n'afọ niile site na Wikimedia Movement na ọnọdụ ụwa niile anyị kwesịrị ilebara anya na, mkpa akụrụngwa na ngwanrọ, ihe ịma aka iwu na nke nhazi, na ihe ụwa kwesịrị ịma banyere ọrụ anyị.
    N'ikpeazụ, akụkụ dị mkpa nke atụmatụ kwa afọ bụ ihe na-adịghị na atụmatụ ahụ. N'oge atụmatụ kwa afọ, ndị ọrụ Foundation na ndị isi ga-atụle mgbanwe dị mkpa banyere ọdịnihu nke ngwaahịa na mmemme anyị. Akụkụ nke a bụ n'ihi na anyị na-ebuli mmefu ego anyị na-arụ ọrụ kwa afọ; n'ụzọ bụ isi, anyị nwere ike itinye ihe anyị na-akpata n'otu afọ n'ọrụ, na obere ego nke ego niile anyị nwetara na-aga na ego anyị (maka ihe ndị a na-atụghị anya ya) na Wikimedia Endowment (maka ego ogologo oge). Ihe anyị nwere ike ịhazi maka ya bụ mmefu ego na atụmatụ ego maka afọ ahụ, yana mkpebi anyị ịnọgide na-enwe ọnụ ọgụgụ dị mma nke mmefu ego mmemme.
    Nye ụfọdụ ndị mmadụ, ọdịdị nke mmefu ego yiri ihe na-agaghị ekwe omume n'ihi oke mmefu ego anyị kwa afọ, mana dị ka ndị na-eme atụmatụ anyị ga-eche echiche nke ọma banyere otu esi eji mmefu ego anyi akwado akụrụngwa teknụzụ anyị nwere ike idebe. Site na oghere a, Wikimedia Foundation pụrụ iche: ọ dịghị nnukwu ụlọ ọrụ teknụzụ ndị ọzọ n'ụwa nwere weebụsaịtị dị oke ọnụ a na-aka aga na ya, nke nwere ndowe akara n'ịntanetị, nwekwara ikike ọtụtụ asụsụ na iji data megharịa ihe nke na-arụ ọrụ dị ka nke mmefu ego na-enweghị uru ma ghara ịme mgbasa ozi ma ọ bụ ree data gị. N'ihi ya, ajụjụ ndị anyị na-eche ihu banyere ha abụghị "gịnị ka ekwesịrị idozi?" kama "gịnị bụ ohere ma ọ bụ nsogbu kachasị mkpa ilekwasị anya n'afọ a? Ndị otu anyị enwere ike inye mmetụta bara uru na mpaghara ahụ na ihe ndị anyị nwere?"
  7. Gịnị bụ "OKRs" na "hypotheses"?
    Anyị malitere iji asụsụ atụmatụ a mee ihe n'ụzọ na-aga n'ihu na atụmatụ afọ 2023-2024, ma anyị ga-anọgide na-eme ya maka ọdịnihu a na-ahụ anya.
    Ezigbo usoro ezi atụmatụ pụtara ịmalite site na mmetụta ma ọ bụ mgbanwe anyị na-atụ anya ime - ihe dị ka ime ka ọdịnaya Wikimedia dịkwuo mfe ịchọpụta, belata oge ntinye peeji n'akụkụ ụwa, na-abawanye njigide ndị ọhụrụ, na-emeziwanye ọrụ onye nchịkwa, ma ọ bụ na-echebe megide ụdị egwu iwu ụfọdụ. A na-egosipụta ihe ndị a dị ka "Ebumnobi", ma ọ bụ nkwupụta nke na-achịkọba mmetụta buru ibu anyị na-atụ anya inweta.
    Nzọụkwụ na-esote bụ ịchọpụta ọtụtụ nkwupụta a na-atụle nke ga-enyere anyị aka iru ebumnuche ndị ahụ buru ibu, nke ọchịchọ ihe ịga nke ọma. A maara ndị a dị ka "mpụtaara dị mkpa" ma na-anọchite anya ụzọ dị elu anyị nwere ike igosi ma anyị emezuola ebumnuche anyị. Site n'ebe ahụ, anyị na-emepụta echiche iji gosipụta otu ndị otu si kwere na ha nwere ike inye aka iji nweta KR. Echiche bụ ebe anyị na-arụ ọrụ zuru ezu iji mezuo ebumnuche anyị. A na-achọta ozi gbasara echiche na ibe ọrụ nke otu.
    N'ikpeazụ, OKRs abụghị iji chịkọba ihe niile anyị na-eme. Enwere ọtụtụ ọrụ dabere na nhazi nke ndị ọrụ Wikimedia Foundation na-etinye oge dị ukwuu n'ime afọ niile, gụnyere ụghalaahịa na njikwa akara, mmezi ngwanrọ na ndozi Bog, ntụkwasị obi na nchekwa saịtị, yana mmekọrịta ọha na eze na njikwa ezi aha.
  8. Gịnị mere ihe niile ji adị ka odochaghị anya?
    Atụmatụ afọ a na-egosipụta nke ọma ihe anyị tụrụ anya ịgbanwe ma ọ bụ inweta n'ime afọ mmefu ego enyere. Ozugbo ihe ndị ahụ dị mkpa pụtara ihe, ndị otu Foundation na-eji afọ na-achọpụta ka ha ga-esi nweta mgbanwe ahụ, dị ka njirimara ngwaahịa ọhụrụ, usoro data, usoro ọrụ injinia, usoro iwu, mkposa mgbasa ozi, ma ọ bụ mmemme ngalaba, yanazi imejuputa ya.
  9. Kedu otu Wikimedia Foundation si enyocha ma kesaa ọganihu na mmetụta?
    Atụmatụ kwa afọ gụnyere akụkụ na metrik nke anyị na-eji tụọ mmetụta na ọganihu anyị megide atụmatụ ahụ. Anyị na-ebipụta ozi a mgbe niile. lee ọmụmaatụ ndị gara aga na Diff-post "Strengthening Connection in the Wikimedia Movement " na mmelite maka ọganihu megide atụmatụ 2023-24 na Diff-post "Progress on the plan: How the Wikimedia Foundation has advanced on its Annual Plan goals".
  10. Atụmatụ afọ ọ̀ bụ otu ihe nye akụkọ mmepụtara nke afọ?
    Mba. Atụmatụ kwa afọ bụ akwụkwọ nhazi nke ọrụ echebere maka afọ na-abịa. Isi Ndị na-ege ntị maka akwụkwọ a bụ ndị ọrụ, yana ndị ọrụ afọ ofufo, ndị n'enye onyinye na ndị na-agụ akwụkwọ. Annual report bụ akwụkwọ nleghachị anya iji gosi mmetụta anyị na ụwa, ma ndị na-ege ntị nke abụ isi bụ ndị n'enye onyinye na ọha mmadụ.

Hụkwa