This page is a translated version of the page Movement Charter and the translation is 100% complete.

Wikimedia Movement bụ òtù mba ụwa, nwere mmetụta omenala ọha, nke ebumnuche ya bụ iweta ihe ọmụma n'efu n'ụwa nile. Movement Charter Wikimedia (“Charter”) na-ewepụta ụkpụrụ, usoro, na amụma ndabere maka usoro njem Wikimedia, tinyere ọrụ na ibu ọrụ dịịrị ụlọ ọrụ ndị dị adị na ndị ọhụrụ, yana ndị otu na-eme mkpebi nke ebumnobi ihe ọmụma n'efu jịkọtara ọnụ . Charter a na-emetụta onye ọ bụla na ihe niile gbasara Njem Wikimedia: ndị niile sonyere n'otu n'otu na ụlọ ọrụ sonyerenụ, tinyere ụlọ ọrụ dịgasị na Otu a, ọrụ, n'ịntanetị na nke n'abụghị n'ịntanetị.

Site n'ịkọwa njem Wikimedia na ụkpụrụ ya, Akwụkwọ ikike a nwere ebumnuche ime ka ọ dịrị ndị ntinye aka mfe ijikọta aka ọnụ n'ụzọ ga-kwado Ebumnuche Njem Wikimedia. Nke a ga-enyere aka:

  • chepụta atụmatụ ga-eweta uto, mgbasawanye, na ohere n'ọdịnihu iji chekwaa nkepụta na-aga n'ihu na nnweta ihe ọmụma n'efu,
  • duzie ime mkpebi;
  • belata esemokwu ma kwalite nkwekọrịta na mmekọrịta dị mma n'etiti ndị ntinye aka
  • chekwaba ikike ndị na-enye onyinye, na ọdịmma ihe gbasara ego nke otu dị iche iche mejupụtara Otu Wikimedia; na
  • nye nkwenye nke ịbụ onye nsonye,

Enwere ike mezigharịa Akwụkwọ ikike a ma ọ bụrụ na achọọ , dịka ngalaba Mmezigharị siri dị.

Ụkpụrụ na Usoro Njem Wikimedia

Njem Wikimedia dabeere na ma na-anabata Usoro eziokwu, nke enwere ike inyocha, nke n'enweghị mgbochi nnweta, na nke na-akwado nsonye nkesa ihe ọmụma. Njem Wikimedia kwesịrị ịdabere na, ma gosipụtakwa ụkpụrụ na usoro ndị a ekekọrịtara.

Ụkpụrụ ndị a ekekọrịta gụnyere ndị dị na mmalite Njem Wikimedia - nnyefe ikike ojiji n'efu na enweghị mgbochi nnweta, nhazi onwe onye na mmekorita, na ozi eziokwu na nke enwere ike inyocha - ma gbasaa na ụkpụrụ ndị ahụ jịkọtara anyị dị mkpa iji mụbaa ọdịnihu anyị. Ụkpụrụ na usoro ndị a kọwara ịkekọrịta ihe ọmụma dị ka mgbalị mmekọrịta miri emi.

Otu Wikimedia bụ Njem dị iche iche, mana Njem a na-anabata ụkpụrụ atọ bụ isi. Ụkpụrụ ndị bụ isi bụ:

Ikikere ojiji na nkesa n'efu

Wikimedia Movement na-eji ikikere ojiji na nkesa n'efu iji kesaa ihe niile ọ na-emepụta, gụnyere, ma ọ bụghị nanị na, ederede, mgbasa ozi, data, na ngwanrọ maka iji ya mewaga ihe, nkesa, na imeziwanye. A na-emekwa ka ụfọdụ ọdịnaya mpụga nke a na-ekerịta n'okpuru ikikere dị iche iche dị maka iji ya mee ihe n'okpuru ikike ojiji na nkesa n'efu. Otu Wikimedia na-agba mbọ ime ka ebumnobi ya dị omimi site n'ịgbasawanye mpaghara nke ihe ọmụma n'efu, site na ijikọta ụdị ihe ọmụma ọhụrụ na nke na-agbanwe agbanwe, yana site na ịbawanye ụdị dị iche iche nke ọdịnaya.

Nhazi onwe na mmekorita

Njem Wikimedia gbadoro ụkwụ n'ọchịchị nkesa. Malite na ntọala nke ndị ọrụ afọ ofufo, Njem Wikimedia na-enyefe ọtụtụ mkpebi na ime amụma n'aka ndị otu onwe na ndị otu ụlọ ọrụ na ọkwa nsonye kacha ma ọ bụ nke kachasị ala. Ngalaba otu gasị ndị nọ n'ịntanetị na ndị na-anọghị n'ịntanetị n'ofe ụwa na-eme mkpebi nke onwe ha, site na ụkpụrụ enyemaka. Otu Wikimedia na-anabata nkpụta ihe, na-ewere ọrụ, na imekọ ihe ọnụ n'ịkwado nsogbu na itinye ụkpụrụ nke Charter a.

Ozi eziokwu na nke apụrụ inyocha

Ọdịnaya Njem Wikimedia na-ezube ịnọchite anya idi ire ihe. Nkọwa nke ịma ama ma ọ bụ nnọpụiche nwere ike ịdịgasị iche n'akụkụ dị iche iche nke Njem Wikimedia , mana ebumnuche bụ inye ihe ọmụma dị ogo dị elu n'ịdị mma. Otu Wikimedia na-aka akwanyere ebe esiri weta dee, nyocha ndị ọgbọ na nkwekọrịta ùgwù. Wikimedia Movement na-ezere ajọ mbunobi niile, oghere ihe ọmụma, na ozi na-ezighi ezi na ozi ụgha.

Na mgbakwunye na usoro atọ ndị bụ isi, Charter a lekwasịrị anya na ụkpụrụ rụtụwara aka n'ezi ọchịchị. Ụkpụrụ ndị a bụ:

nnọrọ onwe

Otu Wikimedia na-agba mbọ ịrụ ọrụ n'onwe ya, na-elekwasị anya ma na-enwe nduzi site na ebumnobi ihe ọmụma n'efu ya, ma na-enweghị mgbochi site n'ihu abụọ ma ọ bụ inye onyinye ile anya n'ihu . Otu Wikimedia jụrụ ikwe ka azụmahịa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ihe gbasara ego , ma ọ bụ mmetụta nkwalite mebie ebumnobi ya n'ụzọ ọ bụla.

Ịha nhatanha

Otu Wikimedia ghọtara na ọtụtụ ngalaba otu ya gasị na ndị otu ha na-eche ihe ịma aka dị iche iche ihu maka inwe nhatanha ihe ọmụma. Otu Wikimedia na-agba mbọ inye ngalaba otu ndị a gasị na ndị otu ha ike imeri akụkọ ihe mere eme, mmekọrịta ọha na eze, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ụdị ndị ọzọ nke enweghị nhatanha ihe ọmụma. Otu Wikimedia na-esoro usoro na-arụsị orụ ike, dị ka ikenye akụrụngwa, iji kwalite na nweta nha anya n'ihe ọmụma site nkesa ọchịchị ruoogo dị ala na inye ngalaba otu gasị nkwado.

Nsonye

A na-emepụta ọrụ Wikimedia n'ọtụtụ asụsụ, na-ngosipụta ọtụtụ mpaghara na Omenala. Ihe omume niile dabeere na nnwekọ nkwanye ùgwù maka ọdịiche nke ndị nsonye n'Otu Wikimedia. A na-eme ka nkwanye ùgwù a dị irè site na usoro iji kwado nchekwa na Nsonye. Njem Wikimedia na-enye ohere dịgasị iche iche, ebe onye ọ bụla na-akwado ebumnuche na ụkpụrụ nke Otu Wikimedia nwere ike isonye ma soro mepụta ihe. Oghere nsonye a na-akwalite nnweta site na enyemaka teknụzụ nke mkpa pụrụ iche dị iche iche.

Nchekwa

Otu Wikimedia ji ọdịmma, nchekwa, na nzochi onwe nke ndị sonyere na ya kpọrọ ihe. Otu Wikimedia na-agba mbọ hụ na gburugburu ebe ọrụ ya nwere nchekwaba na-akwalite ọdịiche, nsonye, iha nhatanha, na imekọ ihe ọnụ, nke dị mkpa maka isonye na ihe ọmụma n'efu na usoro ozi ịntanetị. Ọ bụ ihe kachasị mkpa nye Otu Wikimedia n'ịgbambọ hụ na- enwere nchekwa na oghere ịntanetị na nke na-anọghị n'ịntanetị. A na-akwalite ihe a dị mkpa site na itinye n'ọrụ iwu omume zuru oke, na-inye ngwa ọrụ dị mkpa iji kwado ọrụ ndị a.

Nkereoke ịza ajụjụ

Otu Wikimedia na-ekereoke ịza ajụjụ ya site n'aka ndị isi obodo dịka a na-anọchi anya ya n'ime ọrụ Wikimedia na Ngalaba otu dịgasịna Wikimedia Movement. A na-emejuputa nkereoke ịza ajụjụ a site na ime mkpebi doro anya, mkparịtaụka, ịmara ọkwa ka ihe sịrị dị, nkọwapụta mpụtara ihe omume, na ịkwado Ọrụ nlekọta.

Ikwudosike

Wikimedia na-achake nke ọma site na nkepụta ihe ọhụrụ na nnwale, ma na-emezigharị ebumnobi ya mgbe niile na nlekwasịanya otu ebe ihe ọmụma n'efu nwere ike ịbụ, ka ọ na-agakwa n'ihu na-akwanyere ụkpụrụ na usoro nke Charter a ùgwù. Otu Wikimedia na-agbaso atụmatụ na omume dị irè iji mezuo ebumnobi ya, ma na-akwado ma na-akpali atụmatụ na omume ndị a na ihe akaebe dị mkpa ebe o kwere omume.

Ndị ntinye aka onwe

Ndị ntinye aka onwe bụ isi nke Njem Wikimedia. Ndị nyere aka a nwere ikike onwe ha dị ka onwe onye iji nye aka na Ebumnuche na ọrụ Otu Wikimedia na ihe ọmụma ha, nka, oge na ike, n'ịntanetị ma ọ bụ nke n'abụghị na ịntanetị. Ndị ntinye aka onwe onye na-emepụta ma na-elekọta ọdịnaya; na-arụ ọrụ nchịkwa; sonye na kọmitii ndị ọrụ afọ ofufo; na-ahazi ihe omume; ma na-etinye aka na ọrụ ndị ọzọ dị n'ime Wikimedia.

Ndị ọrụ afọ ofufo

Ndị na-arụ ọrụ n'ọrụ afọ ofufo ha anaghị enweta ụgwọ maka mbọ ndị a; Otú ọ dị, ndị ọrụ afọ ofufo nwere ike ịnata onyinye ma ọ bụ nkwado n'ụdị ndị ọzọ dị iche iche. Ntinye aka n'afọ ofufo na-enwe mmetụta site na nnweta ngwa ọrụ na ihe mgbochi ndị ọzọ.

Ndị ntinye aka na ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ na-etinye aka na ọrụ onwe onye ma ọ bụ nke otu na Njem Wikimedia dabere na mmasị onwe onye, ma ekwesirikwa inye ha nkwado isonye mgbe ọ bụla o kwere omume.

Ikike

  • Ndị ọrụ afọ ofufo nwere ikike ka echebe ha pụọ na mmekpahụ (dịka ọmụmaatụ Universal Code of Conduct (UCoC), Principle of Care) na ebe nrụọrụ weebụ Wikimedia, yana na ihe omume ịntanetị na nke emere n'ihu n'ihu nke ndị otu Wikimedia ọ bụla hiwere.
  • Ndị ọrụ afọ ofufo nwere ikike isonye na ọrụ na ngalaba otu gasị n'ụzọ ziri ezi. Ndị ntinye aka niile na ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ nwere ikike ịkwụsị isonye ma ọ bụ kwụsị itinye aka ruo mgbe ha cheere kwesịrị ekwesị .

ibu Ọrụ dịịrị onye

  • Ndị ntinye aka niile na ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ ga-agbaso ụkpụrụ Otu Wikimedia metụtara ha mgbe ha na-enye aka ma na-arụ ọrụ afọ ofufu.
  • Ndị ntinye aka na ndị ọrụ afọ ofufo ndị ọzọ na-ahụ maka omume ha na ịza ajụjụ maka ntinye aka ha na Ọrụ Wikimedia .

Ngalaba otu Wikimedia gasị

Ngalaba otu Wikimedia gasị bụ otu ndị mmadụ na-enye aka n'ịntanetị nakwa ebe n'abụghị n'ịntaneti iji wuo ma kwalite Ebumnobi Wikimedia . Ngalaba otu ndị dị otú ahụ gụnyere ndị nsonye onwe, ndị ọrụ a na-kwụ ụgwọ, na ndị nnọchiteanya sitere na òtù ndị mmekọ na-agbaso ebumnobi Wikimedia. Ndị Ngalaba otu Wikimedia ndị gụnyere, ma ọ bụghị nanị, Ngalaba otu ndị na-arụ ọrụ, Ndị ngalaba Otu ndị dị n'ime mpaghara, Ngalaba otu lekwasara anya n'asụsụ, na Ngalaba otu ndị teknụzụ/ndị nkepụta. A na-ehiwe, emelite ma na-akwado Njem Wikimedia site na njikọ ọrụ ndị nsonye onwe na nke ndị otu nke ngalaba otu ya.

Ngalaba otu oru ngo nke Wikimedia nwere ikike onwe iji guzobe atumatu maka oru ha n'otu n'otu, ma oburu na atumatu di otu a dabara na atụmatụ dị na Charter na usoro ọrụ nke atumatu uwa nile.[1] Ikike Nnwere onwe a na-enye ndị mmadụ n'otu n'otu na Ngalaba Otu ohere ịnwale na ịkwalite ụzọ mmekọrịta ọha na eze na teknụzụ ọhụrụ. A na-atụ anya na Ngalaba otu ndị a ga-enye ohere nnweta n'efu[2] gbasara ọchịchị ha, usoro ha na ihe omume ha, ka onye ọ bụla nọ na Wikimedia wee nwee ike ịrụkọ ọrụ ọnụ dị ka Otu zuru ụwa ọnụ n'ụzọ ziri ezi na nke enweghi ihu abụọ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mkpebi niile a na-eme na ọrụ Wikimedia nke ọ bụla bụ ndị ntinye aka afọ ofufo, dịka nke onwe ma ọ bụ dị ka otu nwere mmasị.[3]

Ikike

  • Ngalaba Otu oru ngo nke Wikimedia nwere njikwa ndetu nke ọdịnaya n'ime ọrụ onwe Wikimedia ha n'otu n'otu. Usoro atumatu zuru ụwa ọnụ, tinyere Usoro ojiji maka webụsaịtị ọrụ Wikimedia, na-ewepụta njikwa ndetu a.
  • Ngalaba Otu gasị nọ na Wikimedia na-ahụ maka ịkwalite mmezi esemokwu nke ha na usoro nchịkwa n'ime nakwa na nkwekọ na gburugburu iwu ụwa. [4]

ibu Ọrụ dịịrị onye

  • Ngalaba otu Wikimedia gasị kwesịrị inye nkwado ntinye aka na ọrụ ha na ọchịchị ha. Onye ọ bụla na-agbaso ụkpụrụ zuru ụwa ọnụ ma nwee mmasị zuru oke, oge na nkà kwesịrị inye nkwado isonye.
  • Ndị Ngalaba otu Wikimedia kwesịrị ịbụ ndị n'eme ihe ziri ezi ịchị isi na itinye iwu n'ọrụ iji mezuo ebumnobi nke Otu Wikimedia na ịnọgide na-enwe ndigidesike ha n'ozuzu.
  • Iwu na ntuziaka nke Ndị ngalaba otu Wikimedia kwesịrị ịdị mfe ịnweta ma mee ka ọ dị irè.

Ngalaba dịgasị na Wikimedia

Ndị ọrụ afọ ofufo na ndị Ngalaba otu Wikimedia na-ehiwe òtù iji kwado ma hazie ọrụ ha. N'ime Charter a, a na-akpọ òtù ndị a Wikimedia Movement Bodies, nke gụnyere Otu Ọrụ Wikimedia, Wikimedia Foundation, na Global Council. Global Council na Wikimedia Foundation bụ ndị nchịkwa kachasị elu, ma nwee ebumnuche na ibu ọrụ dịịrị ha ha iche iche.

Ka ndị na-enye aka na-enweghi ike nnwete ego na ndị na-enye aka na-eruchaghị sonye n'ụzọ bara uru na ọrụ Wikimedia na mmemme Wikimedia ndị ọzọ, ndị Ngalaba Otu Wikimedia na ndị Ngalaba dịgasịna Wikimedia kwesịrị ịchọ mbelata mgbochi nsonye. Ndị Ngalaba dịgasị na Wikimedia enweghị njikwa nchịkọta ndezi gbasara ụfọdụ ọrụ ma ọ bụ mpaghara ọdịnaya. Ndị Ngalaba dịgasị na Wikimedia nwere Ọrụ nlekọta n'ebe ndị ngalaba otu Wikimedia ha na ha na-arụkọ ọrụ nọ.

A ga-agbanwe Usoro mkpebi esemokwu nnọọrọ onwe ya[5] emebere iji dozie esemokwu nke usoro otu Wikimedia dị adị na-enweghị ike idozi, ma ọ bụ ebe ndị o metụtara enweghị ike ime mkpebi ndị dị otú ahụ n'ihi ihe ndị ha agaghị ejikwanwu. N'ọnọdụ enweghị usoro a, Wikimedia Foundation, ma ọ bụ ndị nnọchi anya ha họpụtara, ga-ewere ọrụ a.

Ndị Otu Wikimedia

Ndị Otu Wikimedia bụ òtù ndị a haziri ahazi nke dị iji mepụta ọnọdụ maka ihe ọmụma dị mfe anaeji n'efu iji nwee ọganihu na mpaghara ma ọ bụ n'usoro isiokwu. Ndị Otu Wikimedia na-arụ ọrụ n'ụzọ kwekọrọ na ebumnobi Njem Wikimedia, ma gụnye ndị mmekọ Wikimedia, họbụ, na ndị ọzọ Global Council[6]ma ọ bụ nke kọmitii ndị a họpụtara nabatara n'ụzọ ziri ezi.

Enwere ụdị anọ dị iche iche nke Ndị Otu Wikimedia:

  1. Wikimedia Chapters bụ ndị mmekọ bụ ndị Otu nọọrọ onwe ha ekepụtara iji kwado na kwalite ọrụ Wikimedia na mpaghara akọwapụtara.
  2. Ndị Otu Wikimedia n'elegara anya n'isiokwu bụ ndị mmekọ bụ otu nọọrọ onwe ha ekepụtara iji kwado na kwalite ọrụ Wikimedia n'ime otu isiokwu ma ọ bụ nlekwasị anya.
  3. Ndị otu ndị ọrụ Wikimedia bụ otu dị mfe ma na-agbanwe agbanwe nke enwere ike ịhazi site na mpaghara ma ọ bụ n'isiokwu.
  4. Wikimedia Hubs bụ otu ndị mmekọ hibere maka mpaghara ma ọ bụ isiokwu[7] nkwado, mmekọrịta na nhazi.

Ndị Otu Wikimedia bụ ụzọ dị mkpa nke Ngalaba otu gasị na Wikimedia nwere ike ịhazi n'ime Njem Wikimedia maka nnyefe ọrụ na mgbalị imekọ ihe ọnụ. Ndị Otu Wikimedia nwere ike iwe ndị ọkachamara n'ọrụ iji kwado ọrụ nke nzukọ ahụ, yana ebumnobi ihe ọmụma n'efu. Ọtụtụ mgbe, a na-enye nkwado a site n'ịkwalite na ịkwado ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo.

Usoro ọchịchị

Ndị Ụkpụrụ njem a, Usoro ime mkpebi na-eduzi, , yana ụkpụrụ ndị otu Global Council hiwere, otu ndị Otu Wikimedia nwere ike ikpebi nhazi ya na ọchịchị ya dabere na ọnọdụ na mkpa. n'ime ngburugburu ọrụ ya. Onye na-eme mkpebi na Otu Wikimedia bụ bọọdụ nzukọ ma ọ bụ otu yiri ya ma na-aza ajụjụ nye otu bọọdụ dị otú ahụ ma ọ bụ otu yiri ya ọ na-anọchite anya ya—dịka ọmụmaatụ, ọgbakọ ndị otu ya.

ibu Ọrụ dịịrị onye

Ọrụ dịịrị ndị Otu Wikimedia gụnyere:

  • Ịkwalite nkwado ndigide nke ndị ngalaba otu Wikimedia nke ndị otu bu n'obi ịkwado,
  • na-akwado nsonye, nha anya, na ọdịdị iche dị n'etiti ngalaba otu ha;
  • na-akwado Universal Code of Conduct (UCoC); , na
  • Ịkwalite mmekorita na njikọ na mpaghara mmasị ha.

N'ihi ọtụtụ ihe, tinyere nkesa ihe onwunwe n'ime njem Wikimedia , Ndị Otu Wikimedia kwesịrị ime ka ọrụ ha na ihe omume ha pụta ìhè site n'inye akụkọ mpụtaara nke anya ọha na eze n'ahụ.

Ndị Otu Wikimedia nwere ike họrọ ịkwalite nkwado ego ha site na mgbakwunye ọgbọ nnweta ego, si otú ahụ na-abawanye ikike Wikimedia n'ozuzu ya. Mgbe ọ dị mkpa, a ga-ahazirịrị mbọ ndị dị otú ahụ maka mpụta ego nye ohere ndị ngalaba dịgasị na Wikimedia ndị ọzọ, gụnyere Wikimedia Foundation na Global Council.

Wikimedia Foundation

Wikimedia Foundation (WMF) bụ ọgbakọ Ebumnuche ha abụghị maka inweta ego na-arụ ọrụ dịka onye isi na nkwado nke nhiwe na teknụzụ nke ihe ọmụma n'efuNjem Wikimedia . ebumnucheWikimedia Foundation bụ inye nkwado na itinye aka na ịkpọkọba ndị mmadụ gburugburu ụwa ịnakọta na imebawanye ọdịnaya mmụta n'okpuru akwụkwọ ikike ojiji n'efu ma ọ bụ na ngalaba ọha, yana ịgbasa ya nke ọma na gburugburu ụwa.

Wikimedia Foundation kwesịrị ịhazi ọrụ ya na ntụzịaka atụmatụ na atụmatụ zuru ụwa ọnụ nke Global Council . N'ịgbaso Ukpụrụ Otu na Usoro Mkpebi, yana ebumnuche WMF, a na-atụ anya na Wikimedia Foundation ga-enye aka n'ikesa nchịkwa na ọrụ dịịrị onye n'ofe Wikimedia Movement. N'ihi otu ihe ahụ, a na-atụkwa anya na Wikimedia Foundation ga-arụ ọrụ maka ikesa ihe onwunwe n'ụzọ ziri ezi, dịka nke ndị kansụl Global hibere site na ntụle ya na ndị nwere oke n'otu ya.

Usoro ọchịchị

N'ịbụ ndị Ụkpụrụ Otu na Usoro ime mkpebi na-eduzi, Wikimedia Foundation nwere ike ikpebi nhazi ya na ọchịchị ya dịka Charter si dị, yana ọnọdụ na mkpa ossi arụ ọrụ. Wikimedia Foundation na-arụkọ ọrụ ọnụ na Global Council , karịsịa n'ihe ndị nwere mmetụta zuru ụwa ọnụ ma ọ bụ mmetụta otua n'ozuzu na Njem Wikimedia.

ibu Ọrụ dịịrị onye

Ọrụ nke Wikimedia Foundation gụnyere, mana ọ bụghị nanị:

  • Ịrụ ọrụ Wikimedia, nke gụnyere ịnabata, iwulite, na idebe isi ngwanrọ; ịtọ usoro ojiji na iwu ndị ọzọ buru ibu; ime mkposa nnakọta ego; ịkwanyere ùgwù na ịkwado nnọọrọ onwe ngalaba otu na mkpa ndị metụtara ya; na itinye aka n'omume ọ bụla ọzọ ka ọrụ Wikimedia wee dị mfe ịnweta ma mee dịka ebumnobi ya sị dị.
  • Na-akwado mmemme akwadoro maka njem Wikimedia; na
  • Ọrụ iwu, gụnyere ilekọta ngwa ahịa, inye atumatu na-enye ohere ka oru ngo na-arụ ọrụ, nrubeisi nke iwu, ịnọchi anya ihe ịma aka iwu, na ịkwalite nchekwa nke ndị ọrụ afọ ofufo.

Global Council

Global Council[8] bụ òtù na-eme mkpebi na-arụkọ ọrụ ọnụ ma na-anọchite anya nke ọrụ ya bụ ịna-ejikọta echiche dịgasị iche iche iji kwalite ihe nlegara anya nke Wikimedia. Global Council na-arụ ọrụ n'akụkụ Wikimedia Foundation na Ndị Otu Wikimedia ndị ọzọ iji kwalite gburugburu ebe ọrụ na-akwado nsonye ma dị irè maka njem Wikimedia n'ozuzu ya na maka ndị niile metụtara ya.

Ebumnuche

Global Council na-eje ozi dị ka nnọkọ ebe echiche dị iche iche nke Otu Wikimedia na-agbakọba, si otú a na-arụ ọrụ dị mkpa n'ịkpụzi usoro ọdịnihu nke njem Wikimedia . Global Council na-achọ ijide n'aka na ọ na-aga n'ihu ịkwado mmetụta nke njem Wikimedia na ụwa na-agbanwe agbanwe site na ọrụ ya nke usoro atụmatụ, nkwado nke ndị Otu Wikimedia, nkesa ihe onwunwe, na ọganihu teknụzụ.

Mkpebi na-aka mma ime ka onye ọbụla mara ma gosipụta mkpa na ihe ndị dị mkpa nke Otu zuru ụwa ọnụ mgbe ọtụtụ olu na ahụmahụ sitere na Njem Wikimedia na-anọchite anya ma sonye na ọkwa kachasị elu nke ime mkpebi. Site n'ịhọpụta na ịhọrọ ọtụtụ ndị otu Global Council site na ọnọdụ afọ ofufo nke Otu Wikimedia, Global Council na-akwalite mmetụta nke onwunwe na ntụkwasị obi siri ike, ka ọ na-arụ ọrụ n'ọhụụ Wikimedia Movement nke ihe ọmụma efu. Iji kwado nsonye na nnochite anya echiche dị iche iche, ndị otu Global Council ekwesịghị ịbụ nke ọha mmadụ si otu ebe karịrị, gụnyere, mana ọnweghị oke na, ọnọdụ asụsụ ọ bụla, mpaghara ala, ma ọ bụ ihe gbasara ọrụ.

Usoro ọchịchị

N'ịbu nke Ụkpụrụ Njem a na Usoro Mkpebi na-eduzi, otu ọgbakọ zuru ụwa bụ Global council nwere ike ikpebi nhazi ya na ọchịchị ya dabere na ọnọdụ na mkpa otu Global Coucil si arụ ọrụ. Global Council na-ekpebikwa nkọwa nke usoro nke ya. Usoro ndị a gụnyere, mana ọnweghị obeghị na: nhazi Global Council, nsonye otu, usoro ime mkpebi, ọrụ na ịza ajụjụ, yana usoro maka ntinye nke olu ọhụrụ na nke anaghị anụcha.

ọrụ

Global council na-elekwasị anya na ọrụ anọ na mpaghara nke mkpebi nke nwere mmetụta kpọmkwem na ndị ngalaba otu Wikimedia na ndị metụtara ya. Global Council nwere ikike ime mkpebi n'elu ọrụ ya niile nke Charter a guzobere. Ndị otu Global Council nwe nkeroke ịza ajụjụ maka mkpebi na omume nke Global Council site na usoro ntuliaka na nhọpụta.

Global Council na-ahọpụta Bọọdụ Global Council , nke na-ahụ maka nhazi[9] na ịnọchite anya Global Council dị ka Charter a na mkpebi nke Global Council nyere iwu. Bọọdụ Global Council na-akwado nguzobe na ọrụ nke kọmitii Global Council na ndị otu ha. Kọmitii ndị a nke Global Council na-ekpebi ihe mejupụtara ha na ụzọ ha si arụ ọrụ, ma nwee ike ịhọpụta ndị ọzọ na-abụghị ndị otu Global Council iji nye aka n'ọrụ ha. Global Council nwere ọ dịkarịa ala kọmitii anọ, onye ọ bụla na-ahụ maka nke ọ bụla n'ime ọrụ anọ akọwapụtara na Charter a.

Atụmatụ Nhazi

Global Council nwere ibu ọrụ ịzụlite atụmatụ ogologo oge[10] ntụziaka Wikimedia maka Njem Wikimedia. Ntuziaka atụmatụ ga-eje ozi dị ka mmalite maka mkpebi ndị Global Council mere na dịka nduzi maka ibute ụzọ na atụmatụ iji nweta ebumnuche atụmatụ. A na-atụ anya na ndị otu Njem Wikimedia niile ga-akwado ntụziaka atụmatụ nke Global Council guzobere ma tinye ya na mmemme na ọrụ ha. Dabere na ntụziaka atụmatụ dị otú ahụ, Global Council na-emelite atụmatụ puru iche zuru ụwa ọnụ a tụrụ aro kwa afọ maka Njem Wikimedia. Global Council na-ewulite ntụziaka atụmatụ na mkparịtaụka ndị niile metụtara ya n'ime na n'èzí Otu Wikimedia.

Nkwado Ndị Otu Wikimedia

Global Council na-eguzobe ụkpụrụ maka ịrụ ọrụ nke ndị mmekọ Wikimedia[11]na Họọbụ Wikimedia. Iji mezuo nke a, Global Council na kọmitii ya na-guzobe ma na-ahụ maka usoro maka nnabata/ịmata nke ndị mmekọ na Họọbụ[12]; gba mbọ ịhụ na Ndị Otu Wikimedia na-akwado ụkpụrụ nhazi Otu; kwado mkpebi esemokwu iji nọgide na-emekọ ihe ọnụ na nkwanye ùgwù n'ime Njem Wikimedia ; ma mee ka ọ dị mfe ịnweta akụrụngwa (ego, mmadụ, ihe ọmụma, na ndị ọzọ) maka nkwado ziri ezi karịa na nkwalite nke ndị otu ngalaba Otu Wikimedia.

Nkesa ihe onwunwe

Gọọmenti Global Council na-eguzobe ma eme nnyocha kwa oge ụkpụrụ na ụkpụrụ nduzi maka nha anya nkesa nke ego[13] na njem Wikimedia n'ikwekọ na ntụziaka atụmatụ. Ụkpụrụ na ntuziaka ndị a ga-agbaso Usoro ime mkpebi. Ọzọkwa, Global Council na kọmitii ya na-ekpebi nkesa onyinye ego ọrụ nye ngalaba otu Wikimedia ya gasị na ndị Otu Wikimedia; chọpụta ebumnuche Njem a na metrik n'ụzọ dabara n'ihe ndị ka mkpa ewepụtara na ntụzịaka atụmatụ; chọpụta oke ego ọrụ mpaghara, isiokwu, na ndị ọzọ; ma nyochaa nsonaazụ mmemme zuru ụwa ọnụ.[14]

Mgbaswanye Teknụzụ

Global Council na-ahazi n'ofe dị iche iche teknụzụ Otu Wikimedia na-elekwasị anya na ndị metụtara ya,[15]ma na-enye ndụmọdụ na nduzi na ọganihu nkà na ụzụ. Global Council na-enyere aka ma na-adụ Wikimedia Foundation ọdụ na-ebute mgbanwe mgbanwe teknụzụ,[16]gụnyere mmeghe ma ọ bụ mmechi nke ọrụ asụsụ Wikimedia, ma na-enyere Otu Wikimedia n'ozuzu ịghọta ihe ndị dị mkpa na ebe ometụtara nkà na ụzụ dị ka edobere na ntụziaka atụmatụ. Global Council ga-arụ ọrụ ndị a site na mmekorita ya na Ndị Ngalaba Digasị na Wikimedia na ndị na-enye aka na teknụzụ n'ịntanetị.[17][18]

Nkepụta mbụ na mgbasawanye n'ọdịnihu

Global Council mbụ ga-enwe ndị otu iri abụọ na ise. N'ime nke, ndị otu iri na abụọ ga abụ ndị a ga-ahọpụta site n'aka ndị otu Wikimedia n'ozuzu ha; a ga-ahọrọ ndị otu asatọ site na ndị mmekọ Wikimedia; otu site na Wikimedia Foundation; na ndị otu anọ fọdụrụ ka a ga-ahọpụtakwa site n'aka ndị Global Council, maka ebumnuche nke ịbawanye nka na ịdị iche iche n'ime ndị otu ya.

Global Council na-ahọrọ pasentị-iri abụọ (20%) nke ndị otu ya ka ha rụọ ọrụ na Bọọdụ Global Council.

Site na ahụmịhe ndị enwetara site na nhazi na usoro mbụ ya, Global Council ga-enyocha ọrụ na usoro dị n'ime iji kepụta, megharia, na tolite dika Otu Wikimedia. Ọ dịkarịa ala otu ugboro kwa afọ atọ:

  • Global Council, na mmekorita ya na ndị ọrụ Otu Wikimedia na-eme nyocha nke ọrụ ya. Nnyocha ahụ ga-agụnye nyocha ma mgbasawanye nke ọrụ Global Council na oke ya maka ime mkpebi ọ ga-abụ ihe a ga-enye ndụmọdụ ma nwee ike ime n'ime oge ọrụ Global Council na-esonụ.
  • Global Council na-enyocha mkpa Otu Wikimedia iji chọpụta ma ọnụ ọgụgụ ndị otu Global Council ugbu a dabara na ọrụ ya. Kansụl Ụwa nwere ike ikpebi ịgbasawanye ma ọ bụ mee ka ọ dị obere n'ihi nyocha a. Kansụl Ụwa nwere ike ịnwe ọnụ ọgụgụ kacha elu nke ndị otu Otu Narị.
    • Ọ bụrụ na ndị Global Council na ndị ọzọ na-etinye aka na ya ahọrọ ịbawanye ọnụ ọgụgụ ndị otu nke Global Council iji jiri nwayọọ nwayọọ wulite isi nke ịdị iche iche na ahụmịhe, ọ nwere ike ime ya n'oge ruo mgbe ndị otu iri abụọ n'ise ọzọ kwa ọnwa iri na asatọ ruo mgbe Gobal Cousil ruru ndị otu Otu Narị.

Mmezigharị

E mere Charter a ka ọ dịgide ruo ọtụtụ afọ. N'ihi nke a, ma e wezụga dị ka enyere n'okpuru ebe a, a ga-eme mgbanwe na Charter a naanị n'ọnọdụ pụrụ iche.

Otu Mmezigharị

  1. Obere Ndezi.
    • Ndezi mkpọpụta na ụtọasụsụ nke na-agbanweghị mpụtara ma ọ bụ ebumnobi nke Akwụkwọ a.
  2. Mgbanwe na Charter a nke na-emetụta naanị usoro ọrụ nke Global Council.
  3. Mgbanwe na Charter a:
    • Mezigharịa ibu ọrụ niile na nsonye n'otunke Council a.
    • Gbanwee ụkpụrụ nke Njem Wikimedia; ma ọ bụ ibu ọrụ na ikike nke ndị ntinye aka onwe, ọrụ, ndị mmekọ, họọbụ, Wikimedia Foundation, ndị Otu Wikimedia n'ọdịnihu, na otu Wikimedia n'ozuzu.
  4. Mgbanwe ndị Wikimedia tụpụtara.
Otu Mmezigharị Usoro Gbanwee Òtù Nkwado Ndetu
1 Nkwado mgbanwe 55% a tụrụ aro Bọọdụ Global Council
2 Nkwado mgbanwe 55% a tụrụ aro Global Council Mkparịta ụka ngalaba otu a tụrụ aro ya
3 Ntuliaka otu zuru oke, nkwado maka mgbanwe 55% Njem Wikimedia Usoro ịtụ vootu iji soro usoro nkwadonnabata ahụ nke ọma dịka o kwere mee, gụnyere ịtụ vootu nkwado site na Board of Trustees Wikimedia Foundation
4 Atụmatụ ga-emezurịrị mmezu iji gaa n'ihu ịtụrụ vootu. Ntuliaka otu n'ozuzu, nkwado maka mgbanwe 55% Njem Wikimedia Usoro ịtụ vootu iji soro usoro nkwado nnabata ahụ nke ọma dịka o kwere mee, gụnyere ịtụ vootu nkwado site na Board of Trustees Wikimedia Foundation

Usoro maka ịtụpụta mmezigharị Akwụkwọ ikike Njem Wikimedia

Ndị otu Global Council Board nwere ike ịtụpụta mmezigharị na ngalaba 1, 2, na 3. Ndị otu Wikimedia Movement na-atụpụta mmezigharị ngalaba nke 4. Mmeghari nke otu nke 4 ga-enwerịrị iru eru nke ụfọdụ ntozu, gụnyere nkwado ọhaneze iji kpalite usoro ịtụ vootu mgbanwe. Global Council na-ahụ maka ịhazi usoro a site na mkparịtaụka ya na ngalaba otu Wikimedia.

Global Kansul ga-ahọpụta kọmitii kwụụrụ onwe ya iji jikwaa ịtụ vootu na mmezigharị Otu 3 na 4. Global council nwere ike ịkọwa usoro itozu ịtụ vootu maka ndị mmekọ na ndị na-atụ vootu n'otu, ma ọ bụ nwee ike inye ọrụ a kọmitii nnọọrọ onwe ya.

Nnabata

A nabatara Akwụkwọ a ma ọ malite ịrụ ọrụ mgbe ntuliaka nwere mpụtara a:

  • nkwado pacentị iri ise na ise site n'aka ndị mmekọ Wikimedia sonyerenu, na opekata mpe ọkara (50%) nke ndị mmekọ tozuru etozu sonyeere na atụm vootu;
  • Nkwado 55% sitere n'aka ndị na-eme ntụliaka n'otu n'otu,[19]na opekata mpe 2% nke ndị ruru eru na-esonye na ntuliaka; na
  • Ndị Board of Trustees Wikimedia Foundation na-atụ vootu iji kwado Charter a.

Asụsụ kacha pụta ihe nakwa Ntụgharị

Enwere ike ịnwe ntụgharị asụsụ Charter a n'asụsụ ndị ọzọ. Ọ bụrụ na enwere ezighị ezi ma ọ bụ nhọtaghie n'etiti ntụgharị asụsụ ọ bụla na nke asụsụ Bekee edere ya mbụ , asụsụ Bekee ga-akwudo.

Ihe Ndetu

  1. Usoro Iwu nke atumatu uwa gunyere ndi edeputara ebe a na ebe a, dị ka Usoro ojiji maka weebụsaịtị ọrụ Wikimedia.
  2. Usoro nyocha ekpughere ekpughe kwesịrị ịdị ire na Ngalaba Otu ọ bụla.
  3. nke Pụtara na "ndị sonyere" iji nyere aka mee mkpebi, ma ọ bụ na-agbanwe ọdịnaya ma ọ bụ amụma.
  4. Iwu Ngalaba otu nwere ike ọ gaghị emegide iwu gburugburu Otu ma ọ bụ ọrụ iwu.
  5. ka a ga-agbanwe ka ọ bụrụ “ekepụtara” ozugbo emebere ya.
  6. tupu mmalite na oge mgbanwe nke Global Council, Ndị Otu Wikimedia bụ ndị Board of Trustees Wikmedia Foundation nabatara.
  7. Charter a na-ahụ Hub Asụsụ dịka ụdị nhiwe nke Thematic Hub.
  8. Na nkwekọ na nnyocha iwu anatara na 2023 maka Charter a, a gaghị amalite Global Council dị ka ụlọ ọrụ iwu.
  9. Bọọdụ Global Council bụ ọgbọkọ e nyere ọrụ: ijide n'aka na usoro dị n'ime Global Council na'ime atụmatụ na usoro oge n'aga nke ọma; ya na ndị ọzọ ịhazi ebe na mgbe ọ dị mkpa; ijide n"aka na Global Council na na-arụ ọrụ ma na-arụkọ ọrụ dịka ebumnuche ya si dị; na ọrụ ndị ọzọ yiri ya.
  10. atụmatụ na-agụnye nnukwu ọrụ iji gbanwee akara
  11. Nke a pụtara ịgụnye ọrụ nke Kọmitii Mmekọrịta (AffCom) na-enwe tupu e kee Global Council.
  12. Nkwekọrịta ikikere ụghalaahịa na nkwekọrịta metụtara usoro a ka bụ ọrụ nke Wikimedia Foundation.
  13. Nke a na-ezo aka na ntinye ego n'obosara.
  14. Nke a gụnyere nsonye ọrụ ndị Kọmitii Ego mpaghara na-arụ ugbu a tupu e kee ọgbakọ Global Council.
  15. Ndị na-ahụ maka ọrụ gụnyere ndị ntinye aka, Wikimedia Foundation,ndị mmekọ, ụlọ ọrụ na ndị ọzọ.
  16. Akwụkwọ dị ka Memorandum of Understanding- ma ọ bụ Service Level Agreement -ka a ga-ekepụta n'etiti Wikimedia Foundation na Global Council ka ha wepụta nkwekọrịta maka otu ha si arụkọ ọrụ ọnụ, gụnyere ka ndị Foundation sị hụta aro Global Council tụrụ.
  17. Kọmitii Global Council kwesiri gosipụta Movement Strategy Initiative for a Technology Council.
  18. A ga-eme mkpebi teknụzụ ikpeazụ site n'aka ndị ahụ raara onwe ha nye maka ịnye ngwaahịa na ọrụ teknụzụ, yana odudu njem ndị ngalaba otu kwesịrị ekwesị na-eduzi jikọtara ya na Global Council.
  19. ndị na-atụ vootu, maka ebumnuche nke usoro nnabata, bụ ndị mmadụ tozuru ịtụ vootu na ntuliaka iji họrọ ndị otu Board of Trustees Wikimedia Foundation