Igbo Wikimedians User Group

This page is a translated version of the page Igbo Wikimedians User Group and the translation is 97% complete.
Outdated translations are marked like this.
    Main pageMembersMeetupsProjectsEventsPartnershipsReportsInternal GrantsBy-laws

    Igbo Wikimedians bụ otu ndị nsonye na ọrụ Wikimidia tinyere uchu n'ịrụ ọrụ Wiki dị iche iche metụtara Asụsụ Igbo na omenala. Otu a bụ otu n'enye ohere njikọ aka n'ọrụ nke otu ndị ọzọ iji kwalite Asụsụ Igbo.O na-enyekwa ohere nsonye nye onye ọbụla maara asụsụ Igbo n'ogo mmụta ọbụ̀la.

    Akụkọ banyere Mmalite Anyị

    Anyị malitere ọrụ Wiki anyị site n'ọrụ akpọrọ Wikipedia Igbo Women Edit-a-thon Project na 2016

    Site na mkpali mmepụtara na ezi nzaghachi dị ukwuu nke ọrụ a nwetere, na ngosipụta na Asụsụ Igbo bụ otu n'ime asụsụ aka asụ na Naijiria; anyị nwere mkpebi ịgbasa ụkpụrụ ọrụ ma hiwe atụmatụ nke gụnyere mgbasa ozi iji kpọbata ndị ndezi asụsụ Igbo bi na Nigeria, ikwalite mmụta nka ndezigharị nke ndị ndezi asụsụ Igbo bi na Naijiria na ngosipụ̀ta nke ikwalite ederede na mpaghara Wikipidịa Igbo site n'ịtụgharị na ikepụta peeji ọhụrụ na asụsụ Igbo,site na nsoro Usoro nchịkọta Wikimedia

    Okwu mmalite

    Igbo Wikimedians User Group bụ otu ndị nsonye ọrụ Wikimedia tinyere uchu n'ọrụ Wiki dị iche iche metụtara asụsụ Igbo na omenala.Otu a bụ Otu n'enye ohere njikọ aka ọrụ nke otu ndị ọzọ iji kwalite Asụsụ Igbo. Ọ bụ otu na-akwado nsonye onye ọbụla nwere nka mmụta asụsụ Igbo n'ogo ọbụla. N'abali Ise nke ọnwa Mee nke afọ 2018,ndị kọmittii Njikota kwadoro arịrịọ maka ọmụmụ anyị dị ka User Group.Nke a bụ Ndetu gbasara nke a.

    Ebumnuche

    • Inye nkọwa ọrụ Wikimedia dị iche iche nye ndị Igbo maara asụsụ Igbo n'ogo ọbụla.
    • Nkwado nye ndị Igbo maara asụsụ Igbo n'ogo ọbụla ka ha bụrụ ndị nsonye.
    • Ichịkọta ọgbakọ na ikwado ndị Igbo maara asụsụ Igbo n'ogo ọbụla ị bụ ndị nsonye nke ọgbakọ.
    • Ịrụ ọrụ na nlebanya nkwalite na mmepe nke ọrụ Wikimedia ndị ọzọ metụtara asụsụ Igbo.
    • Nkwalite nke isiokwu metụtara asụsụ, Omenala na ọgbakọ Igbo.
    • Inwe njikọ aka nke otu,ọgbakọ na mmadụ inweta égo enyemaka ọrụ na ihe ọrụ ndị ọzọ iji kwalite ịnye mmụta n'efu nke ga akwalite ọrụ Wikimedia gbasara asụsụ Igbo.

    Ihe Ndị kọwapụtara Anyị

    Asụsụ Igbo bụ otu n'ime asụsụ ala ana asụ̀kaarị na Naijiria ma ndị n'asụ ya bụ ndị Igbo bụ ụmụ amaala nke mpaghara nkewa ugbu a bụ mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naigeria nke nwere ọnụ ọgụgụ Nde Mmadụ iri atọ na anọ (2016 est) n'etinyeghị ndị Igbo bi na Mba ndị ọzọ. Obere ọnụ ọgụgụ ndị Igbo ka enwere ike ihụkwa nana Cameroon na Mba Equatorial Guinea.

    Ebumnuche otu Igbo Wikimedians User group bụ ilekwasa ezi anya nye ọnụ ọgụgụ ndị n'asụ asụsụ Igbo iji hụ na enyere nkepụta ederede na ọgụgụ Ihe ederede na ngalaba oru Wikimedia Igbo dị iche iche ezi nlebanya.

    Anyị tinyere uchu ịhụ na atụmatụ na ọrụ anyị ga enwe isiokwu n'elebanya ebe asụsụ na omenala dị na ụkpụrụ ọrụ na ihe nlegaranya anyị na nnukwu nlegaranya nke njem Wikimedia ga-enwe njikọ.

    Ndị Chọpụtaara Otua

    Ndị enwere ike ịkpọtụrụ maka Wikimedia Foundation

    Otu Mmalite

    Use this format to sign your name * [[User:Your username|Your real name]]

    Ndị Chọrọ Isonye

    Anyị Chọrọ ndị ọ bụ mmasị ha isonye anyị,Kesaa ma rụọ ọrụ metụtara nlegaranya na ihe anyị chọrọ inweta. Ọ bụ otu na anabata onye ọ bụla maara asụsụ Igbo na ogo ọ bụla.Ebe obibi gị na asụsụ gị abuchaghị ihe dị karichara mkpa.Ọ bụ̀rụ na ịchọrọ isonye, biko zipu ozi osisi nye Tochi Precious site n'ịpịaka na envelop ,Ọ ga azahachị gị tupu abalị abụọ agachaa.

    Atụmatụ Ọrụ

    • Nzụkọ kwa ọnwa
    • Ọrụ ndezigharị ederede.
    • Ọrụ Nseta foto
    • Ọrụ Ụlọ Akwụkwọ Otu Klọb Wiki nke mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijiria na njikọ aka nke ngalaba nkuzi asụsụ Igbo nke Mahadum ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naijrịa.
    • Njem Ikọwapụ̀ta na Nzisa ozi gbasara Otu.
    • Ịma aka Foto
    • Ọrụ ntụgharị Ederede
    • Nkepụta ederede na wikitionary na Wikikwotu

    Ọkwa

    Anyị enweela Templeti nhazi Lexeme Wikidata Igbo.N'ọnwa Mee ahọpụ̀tara anyị dị ka otu n'ime asụsụ tinyere uchu n'ọrụ gbasara lexicographical data nke kpalitere nkuzi mbụ nke Wikidata Lexeme Nkuzi Lexeme Wikidata Igbo na abalị iri ruo iri na otu nke ọnwa Julaị nke afọ 2021.Í nwere ike ị gụ maka nke a ebe a:Wikidata Lexicographical data/Focus languages

    Akara enwere ike iji kpọtụ̀rụ anyị

    Ebe Ụlọ ọrụ anyị dị

    Cavic Nigeria,Nọmba 30 Ogige Agadez, dị na ncherite ihu Ụlọ ọrụ Glo,na Mpụga Aminu Kano Crescent,Wuse 2, Abuja, Nigeria.

    Soshial Midịa: Pịa aka na na ebe mpịaka ọbụla dị na ala iji ga na ogige soshial Midịa anyị