Akwụkwọ ikike Otu/Ngalaba Otu Wikimedia
This was a historical draft of the Wikimedia Movement Charter. The latest version of the Charter that is up for a global ratification vote from June 25 to July 9, 2024 is available in the main Meta page. We thank the stakeholders of the Wikimedia movement for their feedback and insights in producing this draft. |
Ngalaba dịgasị na Wikimedia
Ndị ọrụ afọ ofufo Wikimedia na ndị otu a na-achịkọba otu ọgbakọ iji iji kwado na hazie ọrụ ha. A na-akpọ òtù ndị a dị ka Ngalaba otu dịgasị na Wikimedia na Akwụkwọ ikike a ma gụnye Otu njem Wikimedia dị ka ndị mmekọ na họb, otu nzụkọ zuru ụwa ọnụ, na Wikimedia Foundation. Global Council na Wikimedia Foundation bụ ndị otu ọchịchị kachasị elu, ha nwere ebumnuche na ọrụ nke ha akọwapụtara. Ndị otu Wikimedia Movement nwere Ọrụ nlekọta n'ebe ndị Otu Wikimedia ha na ha na-arụkọ ọrụ nọ
A ga-agbanwe ọrụ mkpebi esemokwu nọọrọ onwe ya[1] iji dozie esemokwu na-enweghị ike idozi site na usoro dị adị, ma ọ bụ ebe enwere enweghị ike ijikwa mkpebi ndị dị otú ahụ n'ihi ihe ndị karịrị nchịkwa ndị o metụtara. Na enweghị ọrụ a, ndị Wikimedia Foundation, ma ọ bụ ndị nnọchiteanya ha họpụtara, ga-ewere ọrụ a.
Ndị Ọgbakọ Njem Wikimedia
Ndị Otu Ọgbakọ Njem Wikimedia bụ otu ahaziri nọ iji mepụta ọnọdụ nke ihe ọmụma efu ka ọ na-eto eto na mpaghara ma ọ bụ gbasara isiokwu. Ndị Otu Ọgbakọ Wikimedia dabara na ebumnuche Njem Wikimedia, ma gụnye ndị mmekọ Wikimedia, Họb, na otu ndị ọzọ nke Kansụl Global nabatara nke ọma[2]ma ọ bụ site na kọmitii ha họpụtara.
Enwere ụdị anọ dị iche iche nke Ndị Otu Ọgbakọ Wikimedia:
- Isi Wikimedia nwere mkpuchi mba akọwapụtara.
- Ndi Otu nsonye Isiokwu nwere mkpuchi zuru ụwa ọnụ ma ọ bụ gafee mpaghara mana na isiokwu dị iche
- Enwere ike ịhazi Otu ndị ọrụ site na mpaghara ma ọ bụ isiokwu.
- Enwere ike ịhazi Họb site na mpaghara ma ọ bụ isiokwu.[3]
Ndị Otu Ọgbakọ Wikimedia bụ ụzọ dị mkpa nke ndị ngalaba otu nwere ike isi hazie n'ime otu a maka ime mmemme na mmekorita. Ebumnobi itinye ọkachamara pụrụiche na ọkwa niile na njem Wikimedia bụ iji kwado ozi ọmụma n'efu nke nzukọ ọ bụla na-ewe ndị ọkachamara n'ọrụ. Ọtụtụ mgbe, a na-eme nke a site n'ịkwalite na ịkwado ọrụ ndị ọrụ afọ ofufo.
Ọchịchị
Nhazi na ọchịchị nke ndị Ọgbakọ Wikimedia nwere ohere ime mkpebi n'onwe ha, dabere na ọnọdụ na mkpa ntinye ọrụ ya. Onye na-eme mkpebi bụ bọọdụ ọgbakọ ma ọ bụ otu yiri ya, na-aza ajụjụ gbasara otu ha na-anọchite anya ya-dịka ọmụmaatụ, otu ndị otu ya.
ọrụ
Ndị Ọgbakọ njem Wikimedia na-ahụ maka nke a:
- Ịkwalite nkwado ndigide nke ngalaba otu nke ndị otu na-akwado,
- na-akwado nsonye, nha anya, na ọdịdị iche dị n'etiti otu ha;
- na-akwado ụkpụrụ omume zuru ụwa ọnụ, na
- Ịkwalite mmekorita na njikọ na mpaghara mmasị ha.
Ndị Ọgbakọ njem Wikimedia kaọdiịrị ime ka ọrụ ha na ihe omume ha pụta ìhè site n'inye akụkọ mpụtaara aga-ekesa n'ihu ọha. Otu Ọgbakọ Wikimedia nwere ike họrọ ịkwalite nkwado ndigide nweta ego ha site na mgbakwunye Usoro nweta ego, na-ahazi mbọ ndị a na njikọ ndị otu Ọgbakọ ndị ọzọ mgbe ọ dị mkpa.
Kansul zuru ụwa ọnụ kwesịrị ịgakwuru ndị otu Ọgakọ njem a dị nụ mgbe enwere atụmatụ maka ndị otu Ọgbakọ ọhụrụ n'otu mpaghara ọrụ (isiokwu ma ọ bụ mpaghara) tụmadị okwu gbasara usoro na ọchịchị nke Otua.
Kansul Zuru ụwa ọnụ
Ebumnobi
Kansụl zuru ụwa ọnụ[4] (GC) bụ ihe nnọchite anya otu atụmatụ nke njem Wikimedia. Ọ na-akwado nsonyengalaba otu n'ime mkpebi iji duzie ụzọ dị mma iji kwalite ihe ọmụma efu.
ọrụ
Usoro ime ezi atụmatụ[5]
Kansul zuru ụwa ọnụ na-ahụ maka mmepe nke Usoro atụmatụ nke Otu[6] tinyekwara nzikọrịta ozi metụtara ya n'ime Njem Wikimedia. GC kwadoro atụmatụ zuru ụwa ọnụ nke na-enyere aka ịnyefe nlekwasị anya na ozi Wikimedia, gụnyere Usoro Ntụziaka atụmatụ Strategic. Ọ na-akwalite, gbanwee, kwado ma kesaa atụmatụ ụwa niile akwadoro kwa afọ maka Njem Wikimedia.
Usoro Njikwa nke ndị Ọgbakọ njem Wikimedia na ngalaba otu[7]
GC na-arụ ọrụ iji hụ na e debere ụkpụrụ kwesịrị ekwesị maka ịrụ ọrụ nke ngalaba otu Wikimedia, ndị mmekọ, na Họb. Iji mezuo nke a, GC na-ehiwe ma na-ahụ maka usoro maka nnabata/ịghọta ndị mmekọ na họb, ma na-eme ka ịnweta akụrụngwa (ego, mmadụ, ihe ọmụma, na ndị ọzọ) dị mfe maka ịkwado ngalaba otu n'ụzọ ziri ezi. Ngwa ikikere ahịa na nkwekọrịta ọrụ metụtara usoro a ka bụ ọrụ dịịrị Wikimedia Foundation.
Otu kọmitii dị n'okpuru nlekwasa anya nke GC na-ahụ maka ijikwa na inye ndụmọdụ na nnabata ma ọ bụ nkwụsị, nnabata, tụmadị esemokwu nke ndị mmekọ na họb. Kọmitiị ahụ na-eme dị ka ụkpụrụ nhazi nke ọgbakọma na-eme ka mkpebi esemokwu dị mfe[8]iji nọgide na-enwe mmekọrịta na nkwekọrịta dabara adaba n'ime Njem Wikimedia.
Ọganihu Teknụzụ
GC ga-eguzobe kọmitii ga-enye ndụmọdụ nye Wikimedia Foundation, na-atụta aro gbadoro ụkwụ na nlekwasị anya Wikimedia na ihe ndị kacha dị mkpa. GC na-eguzobe Kọmitii teknụzụ site na mmekorita ya na ndị na-enye aka na teknụzụ.[9]
Nkesa akụrụngwa
GC na-ewepụta ụkpụrụ na ntuziaka maka ikesa ego n'ụzọ ziri ezi n'ime Njem a nke na-agbaso Usoro ime mkpebi. Na mgbakwunye, GC na-ahụ maka inye ngalaba otu na ndị ọgbakọ Otu ego , dabere na mmefu ego ekenyere. Ọrụ a sitere n'aka ndị nnọchiteanya nke ikike sitere na Wikimedia Foundation nyefee ndị Kansul zuru ụwa ọnụ ka ha na-ahụ maka ọrụ nkesa ihe onwunwe na Njem Wikimedia .[10]
Nhazi
Kansụl zuru ụwa ọnụ bụ ọgbakọ ebe enwere ike chịkọta echiche dị iche iche ọnụ maka ọdịmma dị ukwuu, ọ na-arụkwa ọrụ dị ka otu nkwado nke Wikimedia Foundation na Otu Ọgbakọ njem Wikimedia. A na-ahọpụta ma ọ bụ tuọ vootu maka nhọrọ Global Coucil, site n'ji usoro metụtara ụdịdị dị iche iche, site na n'aka ndi otu ngalaba na gburu gburu Otu a.
Ndị Global Council Assembly (GCA) na Ndị Global Council Board (GCB) mejupụtara Global Council nke ahọpụtara otu GCA .
Global Council Assembly
Global Council Assembly (GCA) bụ otu na-eme mkpebi nke Global Council. A na-ahọpụta,mee ntuliaka ma ọ bụ tụọ aka ndị otu ya, iji weta ụdị echiche na ahụmịhe dị iche iche site na njem Wikimedia dị ka akọwara na Amụma Ndị otu Kansụl zuru Ụwa ọnụ. Ewezuga dị ka enyere na nke a, oge ọrụ nke onye otu GCA ga-abụ afọ atọ. Ndị otu GCA nwere ike ije ozi kacha nke usoro abụọ zuru oke (ya bụ, afọ isii). Mgbe ha jere ozi oge ole a agụpụtara[11] nke usoro abụọ sochirinụ, ha agaghị esonyekwa na nhọpụta na GCA ọzọ ruo ngịwụcha opekata mpe ọnwa iri na abụọ. GCA bụ ndị otu opekata mpe otu narị mmadụ ma ọ bụ karịsịa ndị otu otu narị na iri ise mejupụtara ya.
Opeketampe, a ga-enwe nzukọ kansụl zuru ụwa ọnụ kwa afọ yana n'ime ọnwa isii nke njedebe nke afọ mmefu ego, belụsọ na GCA nyere mgbatị nke oge a. Na Nzukọ kansul zuru ụwa ọnụ a, Global Council Board ga-ewepụta akụkọ mmepụtaara ya kwa afọ maka ihe gbasara Global Council na ihe omume ndị a na-eme. Ọ na-enyefe ihe omume ahụ na nkọwa nye ndị nzukọ maka nnabata.
Usoro ime mkpebi na GCA:
- A ga-eme mkpebi niile site n'ọnụ ọgụgụ zuru oke nke ntuliaka emere. Ọ bụrụ na votu na okwu jịkọtara, a ga-ajụ atụmatụ ahụ.
- Ọ bụrụ na nhọpụta n'etiti ihe karịrị mmadụ abụọ ọ nweghị onye nwetara oke zuru oke, a ga-eme ntuliaka ọzọ n'etiti mmadụ abụọ nwetara ọnụ ọgụgụ kacha elu, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka emechara ntuliaka nwa oge.
- Enwere ike inweta mkpebi n'ezi nzuko site na nkwenye ederede nke ọtụtụ ndị òtù GC niile nwere ikike ịme ntuliaka, ma nke a ga enwe ike dị ka mkpebi nke nzuko General Assembly, ma ọ bụrụ na agafere ya na ihe ọmụma mbụ nke bọọdụ ahụ.
Ọrụ nke GCA gụnyere:
- Ime mkpebi dị elu n'ime na nlekwasị anya nke ebumnuche na ọrụ GC
- ijide GCB ịza ajụjụ maka ọrụ ha
- Ịnọ na ngalaba kọmitii ndị GC
Global Council Board
GC Board (GCB) ga-ahụ maka nhazi[12]ma na-anọchite anya Global Council, na maka nke a, na-enweta ikike ya site na mkpebi GCA. Enyere GCB ikike ịganihu ime mkpebi ndị ọzọ na mmemme ndị a iji mee mkpebi ndị a.
Ndị otu GCA na-ahọpụta, ma ọ bụ rụọ aka onye otu GCB site n'usoro ewepụtara na Amụma Ndị otu Kansụl zuru Ụwa ọnụ. GCB nwere opekata mpe mmejupụta ndị otu ise na ọ karịsịa ndị otu iri na ise.
Oghere enyere Oge ọrụ onye otu GCB ga-abụ afọ atọ. Onye otu GCB ọ bụla ga-eje ozi ruo oge ngwụcha nke oge ha tumadị ruo mgbe ahọpụtara onye tozuru oke ga-anọchi ha, ma ọ bụ ruo mgbe agbam arụkwaghịm ha, nwepụ n'ọfịs, ma ọ bụ ọnwụ. Mgbe ha jere ozi ọ ndị a[13] Usoro abụọ sochirinụ, ha agaghị esozikwa na nhọpụta na GCB ọzọ ruo mgbe oge ngwụcha opekata mpe ọnwa iri na asatọ .
Ọrụ nke GCB gụnyere:
- Ịmepụta usoro atụmatụ Njem Wikimedia nke mbụ, nke dabeere na nkwado nke GCA, dị ka akụkụ nke usoro atụmatụ ọrụ ya,
- Ilekọta na ilebara usoro nhọpụta anya, ịhọpụta ma ọ bụ ịrụaka nke ndị otu ga-esonye GCA,
- Na-eje ozi dịka onye nnọchianya GC na mmemme nsonye ndị otu,
- Na-ahazi ọgbakọ GC kwa afọ,
- Ịnọgide na-aza ajụjụ maka mmezu nke ọrụ nke Global Council, gụnyere ma GCA ma GCB.
Ndị Komitii nke Global Coucil
Kọmitii Global Council na-eme mkpebi kọmitii na ndị otu ha. Kọmiti ọ bụla ga-enwe ọtụtụ ndị otu ya sitere na GCA. Kọmiti nwere ike ịhọpụta ndị otu ndị ọzọ na-abụghị ndị GCA.
Ndị otu kọmitii na-abụghị ndị GCA nwere ike ije ozi kacha nke afọ abụọ n'usoro zuru oke nke afọ atọ nke ọ bụla (ya bụ, afọ isii). Mgbe ha jerela ozi ọ bụla[14] usoro abụọ sochirinụ, ha agaghị esonyezi na nhọpụta na GCA ọzọ ruo mgbe oge opekata mpe ọnwa iri na abụọ gwụchara.
Ụsoro Nkwado
Ndị ndụmọdụ na ndị nọ na-agbata ndị ọrụ
A na-ahọpụta ndị ndụmọdụ na ndị mmekọ ka ha kwado ọrụ nke GC na kọmitii ya dabere na mkpa nke ihe ọmụma na nduzi pụrụ iche. Enwere ike ịkpọ ndị ndụmọdụ ka ha nye mbunye uche, ndụmọdụ, na enyemaka n'ịkwado ihe ịma aka dị mgbagwoju anya na ohere dị n'ime Njem Wikimedia.
Wikimedia Foundation na-ekenye ndị ọrụ[15]na ndị ọzọ akụrụngwa iji kwado ọrụ GC ma nyere ha aka ịrụ ọrụ nke ọma.
Wikimedia Foundation
Wikimedia Foundation (“Ebe ntọala”) bụ ọgbakọ anaghị akwụ ụgwọ na-arụ ọrụ dịka onye isi Wikimedia Movement na-ahụ maka nhiwe ihe ọmụma efu na teknụzụ . Ya na ụlọ ọrụ Njem Wikimedia ndị ọzọ, ọ na-agbaso ọrụ ya dị ka ọrụ enweghi ebumnobi inwe uru. Ọ na-eme nke a n'ụzọ bụ isi site n'itinye ntụziaka usoro atụmatụ ya. Wikimedia Foundation kwesịrị ịgbalị ime ka ọrụ ya kwekọọ na atụmatụ zuru ụwa ọnụ nke Kansụl Global na-ahazi.
Usoro ọchịchị
E hibere usoro ọchịchị nke Wikimedia Foundation na ụkpụrụ iwu, nke mkpebi sitere na Board of Trustees mejukwara, yana site n'atumatu nke metụtara Board of Trustees, ndị ọrụ Foundation. , na ọrụ Wikimedia ọ na-akwado.
Ndị Board of Trustees bụ ndị na-eme mkpebi kachasịnụ, nke enyere ikike n'aka Wikimedia Foundation Chief Executive Officer (CEO). Dịka ụlọ ọrụ enweghi ebumnobi nweta ego, Foundation na-aza ajụjụ sitere n'aka ọha na eze, gụnyere ngalaba otu Wikimedia, ndị omebe iwu na ndị na-nchịkwa, ndị na-eji ihe ọmụma eme ihe, ndị na-enye onyinye, na ọha na eze.
Ndị kọmitii na-adụ ọdụ ma na-akwado Foundation dịka iwu na-achị ya si kwuo ma ọ bụ nweta mkpebi site n'aka ndị Board of Trustee . Kọmitii ndị a bụ ndị ọrụ afọ ofufo nwere ihe ọmụma na mmasị na mpaghara isiokwu kọmitii ndị a, ndị ọrụ Foundation na-akwadokwa ọrụ ha.
Ọrụ
Ọrụ Foundation gụnyere, mana ọnweghị oke na:
- Ịrụ ọrụ Wikimedia, nke gụnyere nnabata, mmepe na idowe isi ngwanrọ; mwube Usoro ojiji na amụma otu a ndị ọzọ bara ụba; na-ahazi mkpọsa nweta ego; omume ọ bụla ọzọ iji hụ na ọrụ ndị ahụ dị ya ma lekwasikwa anya na o metụtara ebumnobi; na, ịkwanyere na ịkwado nnwere onwe nke ngalaba otu na mkpa ndị isi nsonye aka.
- Na-akwado mmemme akwadoro maka njem a,
- Ọrụ iwu, gụnyere ilekọta ngwa ahịa, inye atumatu na-enye ohere ka oru ngo na-arụ ọrụ, nrubeisi nke iwu, ịnọchi anya ihe ịma aka iwu, na ịkwalite nchekwa nke ndị ọrụ afọ ofufo.
Ndetu
- ↑ ka ọ bụrụ “emepụtara” ozugbo emebere ya
- ↑ Tupu mmalite na oge mgbanwe nke Kansul Global,Ndi Otu Ọgbakọ Wikimedia bụ ndị Board of Trustees nke Wikimedia Foundation kwadoro.
- ↑ Akwụkwọ ikike a na-ahụ họb asụsụ dị ka ụdị nke Họb metụtara Isiokwu.
- ↑ na nkwekọ na nyocha iwu Akwụkwọ ikike enwetara na 2023, a gaghị edobe Kansụl zuru ụwa ọnụ dị ka ụlọ ọrụ iwu kwadoro na mbụ.
- ↑ "Usoro ezi atụmatụ" bụ nke gụnyere nnukwu ọrụ iji gbanwee akara Wikimedia.
- ↑ Site na idobe ndụmọdụ nke Usoro atụmatụ nke Otu dịka isi nke mkparịtaụka GC nke metụtara atụmatụ na isi ebe nlekwasa anya nke nchepụta atụmatụ, nkesa akụrụngwa, na ime mkpebi n'ozuzu.
- ↑ N'okwu a, "nchịkwa" na-arụ aka na njikwa na nlekọta nke akụkụ arụmọrụ nke Njem Wikimedia . Ọ gụnyere iguzobe na itinye usoro, atumatu iwu, na usoro iji hụ na ezi arụmọrụ nke ngalaba otu Wikimedia, ndị mmekọ, na Họb.
- ↑ Kansul zuru ụwa ọnụ na-ahụ maka ịmepụta na ijikwa usoro iji kwado mkpebi esemokwu n'etiti Otu njem Wikimedia dị iche iche, gụnyere ndị mmekọ na Hob.
- ↑ A ga-eme mkpebi teknụzụ site na ụlọ ọrụ ndị amaara maka ịnyefe ngwaahịa na ọrụ teknụzụ, tinyere otu kwesịrị ekwesị jikọtara ya na kansul zuru ụwa ọnụ nke ngalaba otu na-achị.
- ↑ Kansul zuru ụwa ọnụ na-eme mkpebi n'akụkụ niile metụtara ọrụ ndị a, na njịkọta aka nke Wikimedia Foundation. Ọrụ dị otú ahụ nwere ike ịgụnye i) iwepụta atụmatụ nkesa ego, usoro atụmatụ, na ụkpụrụ ziri ezi maka njem a, ii) ịtọpụta oke nkesa ego nke mpaghara, otu isiokwu, na ndị ọzọ, iii) ime mkpebi ebumnuche nke Otu na metrik zuru ụwa ọnụ, na iv) ime nyochaa mpụtaara mmemme zuru ụwa ọnụ, tinyere ndị ọzọ nke Global Council kpebiri.
- ↑ Ọ bụla dị ka site na nhọpụta, ntuliaka ma ọ bụ ntụ aka.
- ↑ GCB bụ otu ọrụ na-ahụ na usoro ndị dị n'ime GC na-agba aga n'anya ya dị ka atụmatụ na usoro oge si dị; ha na ndị ọzọ na-ahazi ebe na mgbe ọ dị mkpa, njikwaa nyochaa ọrụ nke GC, wdg
- ↑ nke a dị ka site na nhọpụta, ntuliaka, ma ọ bụ nrụaka.
- ↑ Nke ọ bụla dị ka site na nhọpụta, ntuliaka ma ọ bụ nrụaka.
- ↑ Ndị ọrụ ga-akwado ndị otu GCA na mkpa ha isonye nke ọma na GC. Nke a gụnyere, mana ọnweghị oke na, ịkwado ntụgharị asụsụ na inye nkwado maka ịnweta enyemaka nke ebe nzukọ.