Wikimedia Foundation elections/2021/Candidate Requirements/ig

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2021/Candidate Requirements and the translation is 100% complete.

The election ended 31 Ọgọọst 2021. No more votes will be accepted.
The results were announced on 7 Septemba 2021. Please consider submitting any feedback regarding the 2021 election on the elections' post analysis page.

Nhọrọ nke ndị nlekọta na-eso usọrọ ọrụ nhazi kọmịtịị nke Wikimedia Foundation.Ndị nlekọta na-arụ ọrụ n'ụzọ ezi uche dị na ya, na-arụsi ọrụ ike, ma na-echekwa echiche, na nlekọta nke ndị nwere ezi uche ga-eji.Ọrụ nlekọta a metụtara nhọrọ nke ndị mmadụ ga - arụ ọrụ na kọmịtịị.Udị ndị ahụ ekwesịghị iwetara ndị ọrụ kọmịtịị nkọcha.

2021 Board Elections
Main Page
Candidates
Voting information
Single Transferable Vote
Results
Discussions
FAQ
Questions
Organization
Translation
Documentation
This box: view · talk · edit


Ndi anamachọ kwesiri igụ akwụkwuọ nke kọmịtịị wikimedia foundation ma nyocha iwụ na ọrụ nke nlekọta tụpụ itinyewe dika onye anamachọ

Orụbere Na Ọrụ Rụrụ Ndi Kọmịtịị Nke Nlekọta

Ndi komịtịị nke nlekọta n'elebara anya na oru Wikimedia Foundation. Ezigbo ndị nlekọta na-eme ka njikwa dị mma site n'aka onye isi oche na udiuzọ ọzọ, ndị ọrụ ahụ. Ha anaghị elekọta nzukọ a ọ na-arụ kwa ụbọchị. Ndị nlekọta ọrụ Board gụnyere ime mkpebi, nyocha, na ochichi.

Ọrụ ndị a gụnyere:

  • Ime mkpebi na-atụle atụmatụ na ebumnuche na amuma agwa;
  • Nyochaa arụmọrụ nke Wikimedia Foundation, ihe egwu, ego, na nnabata;
  • Nye ndụmọdụ onye isi oche na ndị okenye n'ọrụ na-eji ọkachamara na ahụmịhe dị mkpa; na
  • Ikwurita uka na ndi obodo Wikimedia banyere orụbere na ọrụ ndi kọmịtịị.

Ndị nlekọta na-ejide iwu na ụkpụrụ omume nke nzukọ. Ha na-anakọta ma zụlite ụdị dị iche iche na kọmịtịị. Ndị nlekọta ga-eme ihe kacha mma maka Wikimedia Foundation. Enwere ike ịhọrọ ndị nlekọta site na vootu obodo, mana ha bata na kọmịtịị, ha abụghị ndị nnọchi anya obodo.

Mụtakwuo maka ọrụ ndị kọmịtịị nke nlekọta na Akwụkwọ Ntuziaka nke kọmịtịị na Wikimedia Foundation.

Nke ruru eru

Ndi anamachọ kwesiri imezụ oru ha n'oru kọmitii. Nke a na-agụnye ịjụ ajụjụ banyere nsogbu dị mkpa, ịme mkpebi nke ọma, na ịga nzukọ ọgbakọ. Ihe ntozu a choro maka ndi anamachọ bu otu ihe maka ndi na atuli aka ya na ihe ndi ozo a:

  • A gaghị ekpe gị ikpe na mpụ dị oke njọ ma ọ bụ mpụ ọ bụla metụtara akwụwaghị aka ọtọ ma ọ bụ aghụghọ;
  • A gaghị ewepụ ọnọdụ gị na ụlọ ọrụ na-enweghị uru ma ọ bụ ụlọ ọrụ n'ihi nrụrụ aka ma ọ bụ omume rụrụ arụ;
  • N'oge nhọpụta ma ọ bụ ntuli aka, A gaghị enwe ike machibido ma ọ bụ gbochie gị na ọrụ ọ bụla Wikimedia maka ụbọchị iri atọ ma ọ bụ karịa;
  • Ọ bụrụ n ’ị ga-ezute ihe tozuru etozu ịtụ vootu dịka onye ndezi: Ihe izizi gị gharịrị igafe 9 Jụụn afọ 2019;
  • Ikwesiri igosiputa ezigbo aha gi na ngwa anamachọ.

Ọ gaghị ekwe omume ijide ọkwa na kọmịtịị nke nlekọta n'okpuru aha ugha n'ihi na njirimara ndị kọmịtịị nke nlekọtabụ ndekọ ọha.

Ngwa Achọrọ

  1. I Nweghị ike ijikọ ngwa ma ọ bụ nkwupụta gị na ndepụta nke nkwenye ma ọ bụ peeji ikpo okwu ndị ọzọ, I Nweghị Ike iso otụ ndianamachọ ọzọ.
  2. A nabatara ngwa n'etiti 00:00 9 Jụụn 2021 (UTC) na 23:59 29 Jụụn 2021 (UTC). Inwere ike ịgbanwe ngwa gị naanị ruo ụbọchị atọ mgbe i tinyere ya, ma ọ bụ site na njedebe nke oge nhoputa na 23:59 29 Jụụn 2021 (UTC). A nabatara Obere mkpoputa ma ọ bụ mmezi ntụgharị asụsụ na mpụga oge ndị a. (Lee ndetu banyere mmezi ntinye ndi a.)
  3. Kwesiri ịnye ihe akaebe nke njirimara gị na Wikimedia Foundation tupu 23: 59 29 June 2021 (UTC). Onye otu Kọmitii Ntuli aka ga-akpọtụrụ gị maka nke a mgbe itinyechara akwụkwọ.

Ndi anamachọ nke n'ewetezụhi ihe ndi achọrọ tụpụ oge enyere aga ewepụ ya.

Nyefee ihe akaebe nke njirimara na Wikimedia Foundation

Ndị anamachọ maka ọnọdụ a ga-enyefe ihe ngosi nke njirimara na ihe akaebe nke afọ nke ọtụtụ dị ka ọnọdụ i bụ onye anamachọ. Otu n'ime akwụkwọ ndị a ga-emezụ nke a:

  • Akwụkwọ ikike ịnya ụgbọ ala
  • Paspọtụ
  • Akwụkwọ ikike ndị ọzọ na-egosi ezigbo aha na afọ

Enwere ike ịnye ihe a na Wikimedia Foundation site na email na secure-info wikimedia.org.

Ọ bụrụ na ị bụ otu n'ime ndị anamachọ ahọpụtara ahọpụta, ndi Wikimedia Foundation nwere ike ịchọ ozi njirimara ndị ọzọ ka ị wee nwee ike ịdebanye nyocha tupu ịhọpụta gị na kọmịtịị.

Etu ị ga-esi tinye anamachọ gị

Ọ bụrụ n'irụrụ erụ, i nyere ike itinye maka i bụ onye anamachọ.