Board of Trustees nke Wikimedia Foundation/Nleba anya

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation Board of Trustees/Overview and the translation is 100% complete.

Wikimedia Foundation
Ndị otu bọọdụ a tụkwasịrị obi


Ndị ntụkwasị obi Wikimedia Foundation na-ekwu maka ọrụ ha

Wikimedia Foundation nwere kọmitii ntụkwasị obi na-ahụ maka atụmatụ Wikimedia Foundation. Ha na-akwado ihe ndị n'ebute ụzọ na ihe onwunwe dị mkpa iji wepụta ha. A naghị akwụ ndị otu bọọdụ ụgwọ maka ọrụ ha ma ha bụ ndị ọrụ afọ ofufo - ha na-achịkọta otu ha sị ahụ ihe na echiche dị iche iche na mkpebi ha. Ị nwere ike ikwu uche gị gbasara onye ịchọrọ ka ọ nọrọ na bọọdụ site na ịtụ votu.

Enwere nnọchiteanya oche iri na isii na Board:
Nnọchiteanya oche asatọ ndị ngalaba òtù na ndị mmekọ,
Oche ndị Bọọdụ họpụtara asaa, na
Otu Oche onye guzobere ya.

Onye otu ndị ntụkwasị obi ọ bụla na-eje ozi afọ atọ.


A na-ahọrọ ndị ntụkwasị obi ahọpụtara site na usoro ọchụchọ zuru ụwa ọnụ. Ha ga-esonye na Board ozugbo Board of Trustees na ndị na-achọ ịzọ ọkwa nwere afọ ojuju na ha kwekọrọ.


Ndị ọrụ ntụkwasị obi na-etinye ihe dị ka awa otu narị na iri ise kwa afọ maka ọrụ ha. Ha na-eje ozi na opekata mpe otu n'ime kọmitii Board. Kọmitii ndị a gụnyere Ọchịchị Board, Ọdit, Ọrụ mmadụ, Nrụpụta, Ọrụ Pụrụ iche, na ihe gbasara ngalaba otu.


Chọpụta ihe ndị ọzọ gbasara Board of Trustees na https://w.wiki/yY9.