Ntụli Aka Nke Wikimedia Foundation /2021/2021-07-02/2021 N'Egosi Ndi Anamachọ

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2021/2021-07-02/2021 Confirmed Candidates and the translation is 100% complete.

Ntuli aka nke Ndị Nlekọta 2021 ga-emepe 4 Ọgọst 2021. A gwara ndị anamachọ si n'ime obodo ka ha pụta. Mgbe izu ụka atọ gara aga maka okụ ndị anamachọ, enwere mmadụ iri abụọ maka ntuli aka nke afọ 2021.

Ndị kọmịtịị nke nlekọta Wikimedia Foundation na-elekọta ọrụ Wikimedia Foundation. Ndị kọmịtịị chọrọ imeziwanye ikike ha na iche iche dịka otu. Ha ekerịtala ebe ndị ọkachamara ha na-ele anya ịchọta ndị nlekọta ọhụrụ.

Ndị otu Wikimedia nwere ohere ịtụ votu maka ndị na-elekọta obodo na ndị nwere mmekọ. E mesịa, a na-atụ anya na ndị kọmịtịị ga-ahọpụta ndi anamachọ anọ akacha tụrọọ vootu ka ha bụrụ ndị nlekọta, bido na Septemba, maka afọ atọ.

Olee otụ i ga esi abanye?

Mụtakwuo banyere ndị anamachọ

Ndị anamachọ si n'ofe ọbodo niile etinyela maka ibụ onye anamachọ. Mụtakwụọ maka onye anamachọ ọ bụla iji mara onye iga atụrụ votu gị. Ndị obodo nyefere ajụjụ maka ndị anamachọ iza ajụjụ n'oge kampeenu ahụ. Ndi anamachọ ga-aza ajuju nke ewetara na ndetụ nke ndi obodo e nwetara na kọmịtịị nke ntụli aka na Meta. N'ime izu ụka na-abịa abia, ndị anamachọ ga enwe ohere itinye vidiyo nke onwe ha na-ekwu maka anamachọ ha.

Soro na ihe omụme kampeenu

Ndị otu nke nhazi na-akwado kọmịtịị ntụli aka a atụlaa atụmatụ maka ụfọdụ ihe ọmụme maka oge kampeenu . Enwere ike ịchọta ihe omume ndị a na peeji nke kọmịtịị nke nlekọta na Meta.

A na-agba ndị otu obodo ume ka hazie ihe omume n’obodo ha. Anyị na-arịọ ka ihe omume ọ bụla metụtara iji tinye aka na ndị na-asọpụrụ oge ha, ebe ọ bụ na ịhọpụta mmadụ nwere ike iwe oge. Biko depụta mmemme ị haziri na ibe ntuli aka nke Kọmịtịị na Meta ka ọtụtụ ndị mmadụ nwee ike ịchọta ha. Ndị na-enyere gị aka na ndị ọrụ afọ ofufo na-ahọpụta ndị ntuli aka dị ma ọ bụrụ na ịchọrọ nkwado.

Vootụ

Ime ntuli aka maka kọmịtịị nke nlekọta maka afọ 2021 ga-emepe na 4 ọgọst afọ 2021 wee mechie na 17 ọgọst afọ 2021. Kọmitii nke ntuli aka họrọ Otu Ntugharị Nyefe Maka usoro ịtụ vootu. Mụtagwuo ihe gbasara ịtụ vootu, usoro, yana ajụjụ a na-ajụkarị gbasara ịtụ vootu.

Ọtu vootụ enyefere

Usoro ntuli aka a na-enyere ndị ntuli aka aka ịhazi ndị ga-eme nke ọma n'usoro achọrọ. Nke a na-enyere ndị ntuli aka aka ịkekọrịta ihe masịrị ha karịa nkwado dị mfe ma ọ bụ imegide votu. Ọ bụrụ na onye ịchọọ ịhọrọ nwere votu zuru ezu ịhọrọ ma ọ bụ na ọ gaghị emeri, a ga-emegharị votu gị na onye ga-ahọrọ gị nke abụọ. Were gabazie. Ndi otu nhazi weputara ihe omuma di mma. Ozi ndi ozo ga abia n’etiti onwa Julai.

Biko gbasaa okwu a ka ọtụtụ ndị mmadụ nwee ike ịkwado ịchọta ndị kacha mma ga-enyere aka duzie Wikimedia Foundation ma kwado mkpa nke ngagharị na afọ ole na ole sochirinụ.

Nke kacha mma,

Kọmịtịị nke Ntuịi aka