Atụmatụ afọ nke Wikimedia Foundation/2024-2025/Mgbanwe n'ewu ewu na Mpụga
Kwa afọ, Wikimedia Foundation na-ekerịta ndepụta nke ihe n'ewu ewu na mpụga nke na-akpali anyị ilepụ anya ma jụọ: "dị ka Njem, gịnị ka ụwa chọrọ n'aka anyị ugbu a?" nkọwapụta ihe n'ewu ewu na-achọ ka anyị weta echiche ogologo oge, na iji nlezianya nyochaa ma lebanya ihe dị mkpa na ọrụ anyị, ọ bụrụgodị na anyị nwere ike inwe echiche dị iche iche banyere otu kacha mma isi zaghachi. Site na gburugburu anyị dị mgbagwoju anya ma na-agbanwe ngwa ngwa, nke a abụghị ndepụta zuru oke nke ihe ịma aka n'ihu na ohere chere Njem Wikimedia ihu, kama ọ bụ nsogbu ole na ole ndị siri ike anyị kwenyere na-eche anyị ihu ugbu a ma nke a na-enyocha kemgbe 2020:
- Chọọ: ndị ahịa nwere ohere njuputa na ozi , ma chọọ ka ndị atụkwasịrị obi Chịkọba ya.
- Ọdịnaya: Ndị ntinye aka nwere ọtụtụ ụzọ nkwụghachi ụgw ọrụ, ụzọ dị ike iji kesaa ihe ọmụma n'ịntanetị
- mgbasa ozi n'ezighi ezi: A na-agbagha eziokwu ọdịnaya karịa ka ọ dị na mbụ, AI ga-eji ngwa.
- Iwu:' ọ na-ebute ihe ịma aka, iyi egwu, na ohere dị iche iche site na ikike
N'afọ a, anyị na-agbasa usoro ọchụchọ na ọdịnaya n'ụzọ abụọ: mgbanwe na mmasị ndị ahịa nke na-emetụta ọchụchọ na nchọpụta ihe ọmụma ịntanetị, yana mgbanwe na ebe na otu esi ekekọrịta ihe ọmụma na-emetụta mkpali ndị na-enye aka.
Trend 1 - Chọọ
ndị ahịa nwere oher njuputa na Ozi, ma chọọ ka ndị mmadụ atụkwasịrị obi chịkọba ya
Gen Z na mmasị puku afọ ndị na-eto eto na ụdị dị mkpịrịkpị, ozi achịkọtara sitere na “ezigbo” mmadụ na-aga n'ihu na-eto. Ọtụtụ nhiwe na-enye ohere nke a karịa ka ọ dịbu na mbụ (dịka, Bluesky, Twitter/X, Substack, TikTok). TikTok na-aga n'ihu na-ewekaarị ọnọdụ, na-eto eto na ojiji zuru ụwa ọnụ ma na-enyekwu ohere ọchụchọ dị mfe. Igwe nchọta webụsaịtị na-enyocha mwepụta AI ọhụrụ iji nọgide na-ịma aka a, mana ihe ịga nke ọma nke njirimara ndị a ka a n-ejighị n'aka.
Ihe ọmụma nkeonwe, nke mmụta dijitalụ kwadoro na-arị elu' N'ime nyocha nke afọ gara aga gbasara usoro mpụga ihe n'ewu ewu, anyị chọpụtara na ndị ojiji na-aga n'ihu na-elebaanya na ngwa ndị na-enye ọdịnaya mgbasa ozi bara ụba dị ka vidiyo na ọdịyo. N'afọ a, anyị na-ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ na-ahọrọ ịnweta ozi site na ngwa ndị na-enye ọ bụghị naanị ọdịnaya mgbasa ozi bara ụba, kama ọ bụ ihe ahaziri nke ọma, ọdịnaya mmụta dijitalụ kpaliri n'ụdị dị iche iche na-atọ ụtọ, nke dị na udị dị mfe ojiji. Ndị na-eji ihe eme ihe na-achọ ndị nwere mmasị, ndị nwere otu echiche ka ha bụ ndị na-ekerịta echiche ha iji chịkọta na hazie ihe ọmụma.
Ihe ọmụma sitere na isi mmalite (ya bụ, ọchụchọ weebụ) na-agafe usoro. Iji gaa n'ihu na-eme ka ndị ojiji ka nwee mmasị, ịnjịn ọchụchọ na-ewepụta atụmatụ ọchụchọ nnyere aka AI ọhụrụ nke na-achịkọta mpụtaara. Ndị a nwere ike bụrụ ụkpụrụ ọhụrụ maka ọchụchọ webụ, na-emetụta mkpugide ọdịnaya nke ndị mbipụta - ma ọ bụ ha nwere ike ịga n'ihu n'enwe ọdịda n'isonye. Ọtụtụ ndị ojiji ejibeghị AI n'ọtụtụ ebe dị ka nnọchi maka ọchụchọ webụ (n'agbanyeghị na ụfọdụ nyocha na-egosi na ndị na-eto eto tụkwasịrị ChatGPT obi karịa Google).
Trend 2 - Ọdịnaya
Ndị ntinye aka nwere ọtụtụ ụzọ nkwụghachị ụgwọ, nke dị ike iji kesaa ihe ọmụma n'ịntanetị
Usoro ịntanetị na-agbasi mbọ ike na-akpọbata ndị ọkachamara na ndị ka na-amu amu ka ha wepụta ọtụtụ ọdịnaya, tinyere ọdịnaya ihe ọmụma. Ndị ntinye aka nwere ọtụtụ nhọrọ maka otu na ebe ha ga-esi kesaa ihe ọmụma n'enweghị nsogbu nye ọtụtụ nde ndị ahịa, ebe ha na-enwetakwa ụgwọ ọrụ ego na nkwụghachị nke onwe.
Ịkekọrịta ihe ọmụma dị mfe ma na-atọ ụtọ ka ọ dị na mbụ. Ngwá ọrụ ọhụrụ maka ịmepụta ọdịnaya mgbasa ozi ọhaneze dịka vidiyo na ngwaọrụ mmepụta ihe na generative AI , nke dịbu ma naanị ndị ọkachamara nwere ike ịnweta ya, dịzị ugbu a nye onye ọ bụla. Ụdị mgbasa ozi ọhụrụ - obere vidiyo, pọdkastị, memes, usoro ihe n'ewu ewu nọ na ikuku, wdg - na-enye ohere maka ịmepụta ihe na ije ozi dị iche iche.
Ịkekọrịta ihe ọmụma nwere nkwụghachi ụgwọ karịa ma dị ike karịa ka ọ dịbu na mbụ. Ndị ntinye aka ọdịnaya na mgbasa ozi ọha na eze nwere nnukwu nkwụhachụị ego sitere na nkwunye ụgwọ na nkwado, ihe mkpali ọha na eze sitere na ntinye aka ndị na-ege ntị (mmasị, ntụnye okwu, na-osuso), ma nwee ike ịkpakọta nnukwu nrute ngwa ngwa na ozugbo, na-achịkọba akụkọ maka ndị na-ege ntị zuru ụwa ọnụ na nde ma ọ bụ ijeri.
Trend 3 - Mgbasa ozi n'ezighị ezi
A na-agbagha eziokwu ọdịnaya karịa ka ọ dị na mbụ, AI ga-ejikwa ngwa ọgụ
Agha ozi ga-akawanye njọ ma ntụkwasị obi na ụlọ ọrụ ga-emebiwanyekwa na 2024, afọ ntuliaka kacha ukwuu n'ime akụkọ ihe mere eme ụwa.Ntuliaka siri ike yana mgbasa nke esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị mpaghara ga-akpali ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, gọọmentị, na ndị ọzọ iji mgbasa ozi n'ezighi ezi n'ịntanetị na-emetụta mpụtaara ntuliaka ma mebie echiche ọha mmadụ zuru ụwa ọnụ gbasara esemokwu agha na njem mmekọrịta ọha.
Iyi egwu ikike ruuru mmadụ na-abawanye iyi egwu anya n'ahụ na nke iwu megidere nke ndị ọrụ afọ ofufo na ndị ọrụ na-alụ ọgụ megide mgbasa ozi n'ezighi ezi na-aga n'ihu. Ebubo nke ikpe ezighi ezi na emeghị ihe kwesiri ekwesi nke mmadụ ndị akụkọ ha chọrọ anọghị na Wikipedia nwere ike ịgba ume ma rie elu site n'aka ndị mgbasa ozi n'ezighi ezi.
Generative AI na-eweta ihe ịma aka ọhụụ, yanakwa ohere. A na-arụgide gọọmentị ka ha kwupụta njikwa ka GenAI na-eme ka enwee ụjọ omume. Uru nke ụkpụrụ ọdịnaya mmadụ na-achị Wikimedia n'ụwa GenAI dị ukwuu, mana iji nọgide na-ịdị mkpa anyị ga-emeri ihe iyi egwu chere anyị ihu nke ọdịnaya anyị na iguzosi ike n'ezi ihe Otu anyị.
Trend 4 - Iwu
Iwu na-ebute ihe ịma aka, egwu, na ohere dị iche iche site na ikike
Site na isi iwu ọhụrụ nke ikpo okwu na EU na UK, anyị na-eche ihu nrubeisi a na-enwetụbeghị ụdị ya, karịsịa gburugburu nchekwa ụmụaka na iji ọrụ AI eme ihe. Ịkwụsị mmanye dị ize ndụ - karịsịa n'aha nchekwa ụmụaka - chọrọ agụmakwụkwọ ka ukwuu nke ndị na-eme iwu gbasara udi anyị.
A na-eji iwu eme ihe na mpaghara ndị dị mkpa.' ime mkpesa ikpe ọjọọ, nke ndị mmadụ na-adịghị enwe mmasị ozi ntụkwasị obi nke pụtara na peeji Wikipedia, na-aga nke ọma n'ụfọdụ mba Europe. Ụfọdụ ndị ndú nọ n’ọchịchị na-eji ikike ha eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi iji mechie ọnụ ma majaa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-emegide ha.
Ụfọdụ ndị na-eme iwu na-enwe mmasị otú Wikimedia si eme ka mmasị ọha na eze na mmepe na-adịgide adịgide. Na ọgbakọ Europe ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ahụ Wikipedia dị ka akụrụngwa ọha dijitalụ kwesịrị nkwado, na-aghọ ihe nlereanya maka iji nkà na ụzụ na-akwalite ọdịmma ọha na eze na-enweghị isi na-akwadoghị. ibu usoro iwu. Ndị otu UN na-ajụ ka ọrụ anyị nwere ike isi kwalite ebumnuche ndigide mmepe.