Ojije akwụkwọ ikikere /ọdịnaya /uru na ụkpụrụ

This page is a translated version of the page Movement Charter/Content/Values & Principles and the translation is 44% complete.
Outdated translations are marked like this.


Ngosiputa banyere uru na ụkpụrụ dị iche iche nke isiokwu nke sitere na ndị otú MCDC Georges Fodouop.

Anyị na anọchite anya ndị okwu na eziokwu, ghere oghe,na agbaso ụzọ ntinye n' ebe amamihe dị. Ihe edemede anyị dị iche iche n' egbo mkpa amamihe n' ebe ụwa niile dị, ebe ndabere na ahụ maka ile ọbịa banyere edemede nchọcha bụ nke gbagidere ụkwụ na ebumnobi nwere onwe. Ụkpụrụ anyị na ihe mmegharị aka anyị mgbe niile bụ nke na ehinye isi na uru ụmụnna nke na a kwalite ndị otu Wikimedia na mba niile nke ụwa ka ha wee nwee ike isonye si ike na ndabere nhata nha.

Uru na ụkpụrụ dị iche iche nke anyị,hudoro ama na usoro nke a iji mee ka nghọta rute onye ọ bụla aka bụ ihe ọnye ọ bụla ga etinye oké ya ma bụrụ n'obi idebe uche na ihe e lekwasịrị anya:

Nghọta n' efu na usoro ghere oghe

Anyị n' eketa oké na nghọta bụ n' efu, ọdịnaya nke anyị n'niile, ngwa sooftwee niile anyị, ụzọ nzirite ozi anyị n' ebe anyị na ndị ọzọ nke mba ụwa dị, i jiri Ngbanwe ngwangwa nke ikikere ghere oghe. Anyi kwesịrị ntụkwasị obi maka inye oghere banyere nghọta nke nwere ezi ntuala ihe okpu nke arugideworo - ọ bụla dị n'ime edemede nchọcha nke anyị.

Nnwere onwe

Anyị na a gbalisike iru ọrụ n'inwere onwe, na enweghị ngọsipụta ịhụnanya nke puru ị machibido ije ozi nghọta n' efu nke anyi. Anyị anaghị agbaso uzo na usoro azuma ahịa, ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ọ bụ ụzọ mbuli elu ndụ ọzọ.

Ntinyere

Anyị na a kwalite ebum n' obi ọma n'ihe banyere mmadụ iji gbaa mbọ n'ime pụta ìhè. Ihe edemede nchọcha anyị k' anyị neme ka ọ pụta ìhè na asụsụ niile, bụrụ kwa ihe ga erute ọnye ọ bụla aka na ọgbara dị iche iche site na nhazi ọzuru ụwa onu na enyemaka teknụzụ. Ihe omumu anyị na arunye ma n'echekwa nd'iche na ihe ruru ụmụ nna anyị. Iji mee nke a, anyị mebere ma chekwaa usoro na iwu, ma hụ na onye ọ bụla nwetara mmetuta n' oké uru na onye nọ tara nke ọma.

Ndị enyemaka

Anyị na a tụkwasị ikikere n" aka ndị ọbodo dị nso ma kwesịrị Kw ekwesị, na ụzọ njikọ ta anyị ya na ndòzi ọchịchị anyị. N'ihi nkea, anyị na ekwenyela si ike inweta mgbalisike nke onwe na nnoro onwe nke ụmụnna nke na arụ ọrụ na njikọ aka tinyere uru nke ojije Mba Ụwa.

Nhata nha

Anyị na adonye ike na akwado ndị ụmụnna site na mgbasa na nkesa nke nwere onwe. Tinyere nhata nha na nnochite anya nke nghọta, anyị na anabata nhata nha nke ngwa ọrụ. Anyi na anabata nghata nha nke ihe ruru ìgwè nzirita ozi ndị dịka : nkwanyere nke ndị eji ihe anyị eme ihe na ndị nsọ ye niile na ebe nọ nso na ebe dị anya.

nguzi

Anyị na edebe onwe anyị inye nguzi site na mmpute ihe nke ihe ndị ede ziri nke ọma ebe ozi nke ọha na eze na nkwupụta nke ihe omume nke mgbasa ozi na mmemme, na ezi nhọrọ nke olu nnochite anya nke ndị ọchịchị ụmụnna maka ọrụ nke ye na ibu ọrụ edenyere na akwụkwọ ikikere ga adị nfe.

Nrusioru ike

Anyị na a gbalisike site n'itinye ihe ọgbara ọhụrụ ya na nnwale, na enyocha mgbe niile ihe ebum n' uche nke ịkpọ okwu maka nghọta n' efu nwere ike ịbụ. Anyị na achụso ezigbote usoro dị iche iche na nnwale nke agbapụtara nke agbapụtara site na ihe ahụrụ anya. Anyị a kwalite omenala nke nnosike gafereihe ndị anyị rụpụtara tinyere ụmụnna.