Usoro Mgbaso ime njem/Atụmatụ/Ámụ̀mà Ịwulite ndị ndú

This page is a translated version of the page Movement Strategy/Initiatives/Leadership Development Plan and the translation is 100% complete.

Ụzọ zuru ụwa ọnụ gbaa gburugburu esi akwalite ǹkà nke onweonye

Ọbụrụ na anyị chọrọ itinye ego na úchú n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú, anyị ga-enwerịrị usoro ịkwalite ịbụ ndị Ndú achikọtara ma hazie nke ọma. Ebe enwere ike ịkọwa okwu a bụ "nduzi" n'ụzọ dị iche iche maọbukwanu n'ụzọ na-adakataghị mgbe ụfọdụ, ọrụ nduzi ekesara ekesa nye ndi dị iche iche kwesịrị ekwesị n'òtù ọbụla, enwekwara ọtụtụ ọrụ ndịa n'òtù ha, kọmitii ha, na Bọọdụ ha dị iche iche n'okpuru Wikimedia. Nchepụta a bụ maka iguzobe usoro omume ga-adịgide a ga na-eso idetu ọrụ ndị a gasị, nakwa ịzụpụtakwu ndị mmadụ ndị ọzọ ndị ga na-arụ ọrụ ndị ahụ. Nkea ga-enye aka ime ka ndị ndú na-adị ọhụụ mgbe niile, gbochie umengwu ọrụ na-erụghị eru, mee ka ndinaya dị iche iche juputa, nkekanke, nyere ndị ndú aka ikwado obodo ha dị iche iche ruo n'ógó ọbụla ha chọrọ ya. Usoro omume a ga-aganyekwa na ịchọpụta ndi ga-abụ ndị ndú n'ọdịniihu ma nyekwa ha ọzụzụ n'ógó dị iche iche nke ha nọ na ya, ma ógó dị àlà, ma nke dị elu.

Enwere òtù kọmitii dị ugbua nke a na-akpọ Leadership Development Working Group Leadership Development Working Group, nke metụtara atụmatụ a n'ụ̀mị̀.

Kepụta atụmatụ ịkwalite ịbụ ndị Ndú na-eso ụkpụrụ, ma bụrụkwa nke achikọtara ọnụ ma hazie n'ụwa gbaa gburugburu. Nke a gụnyere na anyị ga:

  • Iguzobe usoro omume iji ghọta na mee Ndúzi ka ọ bụrụ ihe nlereanya dabeere na ǹkà kwesịrị ekwesị na Mgbe ọbụla.
  • Were ngwá ọrụ na usoro omume ihe dị iche iche ndị dị, were rụọ ọrụ nke ga-adabere na ole ha dị, bụ ndị nyere onwe ha ịrụ ọrụ, nke na-enyere obodo aka ịchọpụta ndị nduzi dị n'ime ha.
  • Kpọọ ndị ga-abụ ndị ndú n'ọdịniihu ndị si na òtù ndị ọzọ ka ha kesaa ahụmahụ na mmụta ha niile n'òtù nkea, iji mee ka enwee ndịnaya na ihe mmụta dịkwa iche iche n'òtù a.
  • Mee ka ọtụtụ ụzọ dị iche iche dịrị, nke ndị na-amụ ihe ga-esinwu mụọ ya (ọmụmaatụ n'ikuku ịntanetị maọbu na mmadụ) n'ógó dị iche iche ka ndị mmadụ nwee ikike ịmụta ǹkà nduzi ha ga-eji arụ ọrụ ebe ọbụla ha nọ mgbe ahụ.

Participate

Discuss

Join or start a discussion on Meta or the "Tinye ego n'ikwalite ǹkà na ịbụ ndị Ndú" space of the Movement Strategy Forum.

Create

Apply for a Movement Strategy implementation grant to create a project that advances this initiative.

Get help

If you need help in getting involved, please don't hesitate to get in touch directly with members of the Movement Strategy and Governance Team. They are here to help!

You can write to the team in any of 19 languages (listed on the team's page), by writing an email to: strategy2030@wikimedia.org

Ọrụ ndị a ga-arụpụta

Initiative Project Stakeholder type Project lead Geography of the project Implementation Phase
33. Leadership development plan Overall Initiative Coordination
33. Leadership development plan Leadership Development Working Group WMF Community Development Pilot
33. Leadership development plan Consensus Making with Musyawarah-Mufakat (Indonesia) Chapter Wikimedia Indonesia Execution & Implementation
33. Leadership development plan Leadership development actions - WM Chile Chapter WM Chile Latin America & The Caribbean Completion & Reporting
33. Leadership development plan Training of Brazilian Leaders User group Wiki Movement Brazil User Group Latin America & The Caribbean Implementation