Movement Strategy/Atụmatụ/Usoro ikenye akụrụngwa na-agbanwe agbanwe

This page is a translated version of the page Movement Strategy/Initiatives/Flexible resource allocation framework and the translation is 100% complete.

Usoro ikenye akụrụngwa na-agbanwe agbanwe

Ka e wee hụ na enwere nhata nha n'usoro ime mkpebi, anyị kwesịrị ikesa akụrụngwa nke enwere ike igbanwe mgbe ọ bụla. Usoro nkesa akụrụngwa a dị mkpa iji nye aka n' inweta ego mmemme mmejuputa usoro nke otu dị iche iche na-eme. Ekwesịrị ka emebekwa oke ego a site na ntụle ya na ndị obodo, site na otu usoro nke Movement Charter. O kwesiri inwe njirisi na-agbanwe agbanwe nke emeghariri na onodu di iche iche ka ndi obodo wee sonye na mkpebi ego na-emetụta ha. Usoro ahụ kwesịkwara ịkwado nhata, dịka ọmụmaatụ: site n'inye ego na-agbanwe agbanwe na oge na-agba we agbanwe. Kansụl zuru ụwa ọnụ, ozugbo emebere ya, ga-ahụ maka oke nke akụrụngwa dịka usoro a siri dị. Ụlọ ọrụ ga-esokwa na-ekesa ego dịka usoro nkesa akụrụngwa siri dị.

  • N'ọdịnihu dị nso, otu Wikimedia Foundation kwesịrị ịbawanye ego na akụrụngwa ndị ọzọ enyere na otu a maka ebumnuche mmezu nke Movement Strategy.
  • Ihe ndị a agbakwunyere kwesịrị ịkwado otu mpaghara ọhụrụ na otu ndị ọzọ dị iche iche na mgbakwunye nke òtù ndị dị ugbu a.
  • N'oge na-adịghị anya, otu a kwesịrị ịrụ ọrụ ntụzịaka na okike akụrụngwa. Ekwesịrị ịhazi usoro maka okike site na ntụle na mkparita ụka ma kọwaa ya na Movement Charter. Ntugharị a na ntụzịaka nke mmegharị a bu nke e kwesịrị ime kwa mgbe kwa mgbe.
  • Kansụl Izugbe kwesịrị ilekọta mmejuputa ntuziaka nke otu nyere dị ka akọwara na Movement Charter, nke gụnyere ndụmọdụ maka ikenye ego nye otu mpaghara dị iche iche nakwa òtù ndị ọzọ ka ha na-amata ọrụ iwu na ntụkwasị obi nke òtù ndị nke a metụtara.
  • Na ndabere nke usoro nke kansụl Izugbe setịpụrụ, otu mpaghara dị iche iche nakwa òtù ndị ọzọ ga-ahazi ikenye akụrụngwa site na ụzọ ndị a pụrụ ịdabere na ya, ndị na-agbanwe agbanwe, nakwa ndị a pụrụ ilekwasi anya iji chekwaa na ịkwado obodo na òtù ndị nwere atụmatụ ọtụtụ afọ.
  • Usoro ntinye ego ga-adị mkpa ka ọ bụrụ nke na-agbanwe agbanwe n'usoro ogologo, ijikọ ebumnuche atụmatụ nke otu a na mkpa na ntụzịaka mpaghara, ịkọwapụta ajụjụ ọnụ, yana imepe ụzọ maka atụmatụ ego mpaghara.

Participate

Discuss

Join or start a discussion on Meta or the "Igba mbọ hụ na enwere nhata n'ime mkpebi" space of the Movement Strategy Forum.

Create

Apply for a Movement Strategy implementation grant to create a project that advances this initiative.

Get help

If you need help in getting involved, please don't hesitate to get in touch directly with members of the Movement Strategy and Governance Team. They are here to help!

You can write to the team in any of 19 languages (listed on the team's page), by writing an email to: strategy2030@wikimedia.org

Initiative Project Stakeholder type Project lead Geography of the project Implementation Phase
27. Flexible resource allocation framework Overall Initiative Coordination
27. Flexible resource allocation framework Regional Grant Committees WMF Community Resources

Movement Strategy & Governance

Global Execution & Implementation

Akwụkwọ ndị metụtara nakwa mkparịta ụka

Ụfọdụ n'ime mkparita ụka gara aga, ederede na ụdị ochie nke ntụnye usoro ngaghari nke nwere ike inye nkọwa ọzọ na atụmatụ a: