This page is a translated version of the page Grants:MSIG/Approach and the translation is 100% complete.

Usoro nke Movement Strategy Implementation Grants Approach nke afọ puku abụọ na iri abụọ na otu rue na afọ puku abụọ na iri abụọ na abụọ na-aga n'ihu na nzọụkwụ atọ dị mkpa. Nzọụkwụ ndị a na-enyere anyị niile aka ịnọgide na-elekwasị anya na ebumnuche anyị niile nke mmejuputa atụmatụ mmegharị site na afọ puku abụọ na iri atọ. Ebumnuche nke usoro ndị a bụ ịkwalite mmekorita na nchịkọta nzaghachi iji duzie atụmatụ enyemaka.

Nzọụkwụ mbu - Chọpụta atụmatụ ndị otu obodo na-achọsi ike itinye n'ọrụ

N'ime agba nke a, onyinye na-elekwasị anya na atụmatụ anọ:


prioritized initiatives:

Ebe ọ bụ na usoro ndia bụ nke a chọpụtara, I nwere ike ịsụnye nchepụta gị banyere ihe omume ndị ọzọ. Ọ bụrụ na enwere opekata npe nchepụta ise dị iche iche na otu ụdị nchepụta, anyị ga ana abata na otu aka ahụ.

Nzọụkwụ nke abuo- Chọta echiche ọhụrụ site na itinye aka na ọrụ nke ndi umunna

Ndị obodo ma ọ bụ ụmụnna di iche iche nwere nghọrọ dị iche iche, n'ihi ya echiche dị iche iche banyere ihe ana ememe na ọdị n'ihu. Anyị n'ele anya ịmụta kwụ ihe banyere mkpa gị hà tinyere nghọrọ na usoro na ụzọ mkpa ndị ahụ ga abụ ihe egboro egbo site na Movement Strategy Implementation.

Mkparịtaụka na nkpokorita dị iche iche banyere nchepụta echiche pụrụ iwe ịgbambọ na nhazi na nchịkọta. Ndị otu Movement Strategy na Governance pụrụ iweta nkwado nke nkà n'uzu maka ndị ụmụnna na ndị affiliate, na a kparita ụka na nchepụta ọ hụrụ ndị a nke metụtara focos Initiatives.

Echiche ndị na-aga n'ihu site na ntinye aka nke ụmụnna ma ọ bụ obodo a, nwere ike iduba n'ibute ụzọ na atụmatụ ndị ọzọ.

Biko tulee mkparịta ụka ndị nke na-aga n'ihu metụtara echiche gị tupu ịmalite mkparịta ụka ọhụrụ.

Nzọụkwụ nke atọ - Mepụta atụmatụ iji mezuo atụmatụ

Anyị ga-achọsi ndị mmekọ na ndị ọrụ afọ ofufo nwere mmasị n'ịmepụta atụmatụ iji mezuo atụmatụ ndị a lekwasịrị anya na echiche ndị ọzọ na-apụta. Site na ha, anyị ga-emepụta ihe ilere anya iji nyere gị aka itinye atụmatụ nke gị.

E nwere rịị ndepụta nke echiche ndị anakọtara ruo ugbu a.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịhụ ihe imaatụ maka atụmatụ ndị na-abụghị ihe a na-elekwasị anya na otu ụzọ n'ụzọ anọ, mana nke na-amasị gị, ị nwere ike ịgakwuru ndị ọrụ afọ ofufo na ndị mmekọ, ma mgbe enwere ndị na-asụnye maka ọrụ mmadụ ise, anyị ga-elekwasịkwa anya na atụmatụ ahụ ma mepụta ihe atụ ndị nwere ike inyere gị aka.