Ntuliaka Wikimedia Foundation/2024/ ntuziaka ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2024/Candidate guidelines and the translation is 100% complete.

Ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ga emeriịri ihe a

  • Ga akwanyere Universal Code of Conduct ugwu ma sopụrụ iwu Friendly Space Policy;
  • Bipụta ọdịnaya gbasara nhọpụta ha na mmemme ntuli aka naanị na oghere ịntanetị ebe ndị nhazi oghere nabatara ya;
  • Mee Mgbasa ozi dịka onwe onye, ọ bụghị dịka otu ndị na-eme ntuliaka; na
  • Soro ntuziaka nke isonye na mmemme dịka ndị na-ahazi mmemme siri hazie ya (ya bụ, ọ bụrụ na ndị na-ahazi na-arịọ ndị na-eme ntuliaka ka ha ghara ime mkpọsa mgbe ahụ ekwesịrị ịkwanyere ya ugwu).

A na-atụ anya na ndị na-adọ ndoro-ndoro ochichi ga:

Ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ agaghị eme

  • Aga nnọkọ Board of Trustees Nkè metụtara ntuliaka otu ngalaba[1] na-enweghị nkwado mbụ site na Kọmitii Ntuliaka. Kọmiti ahụ ga-anabatakarị ọbịbịa na mmemme, mana e nwere ike nwee oke ma ọ bụrụ na ọdịdị, nha, ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ nke ihe omume ga-abụ ihe na-ezighi ezi nye ndị ọzọ ga-eme ntuliaka. Arịrịọ maka ọbịbịa ga-enwerịrị oge tupu oge eruo.
  • Jiri nkwupụta onye ndoro-ndoro ochichi ha[2]iji jikọta ndepụta nkwado ma ọ bụ ọdịnaya echere iji gafere ọnụ ọgụgụ okwu (dịka blọgụ, Google Docs, ibe, wdg)[3]

Ndetu

  1. nke gunyere ma na ntanetị mana ihu na ihu
  2. mara amara na template ewepụtara ga-ejikọta na ibe onye ọrụ onye ọ bụla
  3. A na-ahapụ ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ka ha jikọọ na ibe ndị dị mkpa, gụnyere n'ime ọrụ Wikimedia na profaịlụ ọkachamara ha (dịka ibe ndị ọrụ, LinkedIn, wdg)