Ntuliaka nke Wikimedia Foundation/2024/Ịma ọkwa/ ịma ọkwa nhọrọ

This page is a translated version of the page Wikimedia Foundation elections/2024/Announcement/Selection announcement and the translation is 100% complete.

Nhọrọ Board of Trustees nke 2024 Wikimedia Foundation

Ị nwere ike ịhụ ozi a ka a tụgharịrị n'asụsụ ndị ọzọ na Meta-wiki.

Mmadụ niile,

N'afọ a, ọkwa nke 4 (anọ) nke ngalaba otu - na Mgbakwunye-nhọpụta ndị nlekọta na Board of Trustees Wikimedia Foundation ga-abịa na njedebe [1]. Ndị Bọọdụ na-akpọ òtù niile òkù ka ha sonye na usoro nhọpụta nke afọ a na votu iji mejupụta oche ndị ahụ.

Kọmitii Ntuliaka ga-ahụ maka usoro a site na nkwado ndị ọrụ Foundation [2]. Kọmitii na-ahụ maka nchịkwa ahụ mepụtara otu ndị na-arụ ọrụ ọrụ Board site na ndị nlekọta ndị na-enweghị ike ịbụ ndị na-adọ ndọrọ ndọrọ ntuliaka na otu ngalaba -na mpaghara nke ndị mmekọ ahọpụtara onye nlekọta nke Dariusz Jemielniak, Nataliia Tymkiv, Esra'a Al Shafei, Kathy Collins na Shani Evenstein Sigalov. [3]. Enyere otu a ọrụ inye nlekọta Bọọdụ maka usoro nhọpụta ndị nnọchi anya 2024, yana ime ka ndị Board mara ihe n'eme. Nkọwa ndị ọzọ gbasara ọrụ nke Kọmitii ntuliaka, Bọọdụ, na ndị ọrụ nọ ebe a [4].

Nke a bụ isi ụbọchị akwadoro:

  • Mee 2024: ịkpọ oku ndị chọrọ ịdọ ndọrọ ndọrọ na ịnabata ajụjụ
  • June 2024: Ndị mmekọ atụọ vootu iji nweta ndị ga-azọ ọkwa iri na abụọ (enweghị ndepụta aha ma ọ bụrụ na ndị ndọrọ ndọrọ mmadụiri na ise ma ọ bụ erughi bụ ndị tinyere akwụkwọ) [5]
  • Juun-Ọgọọst 2024: Oge mkpọsa
  • Ngwụcha Ọgọọst / mmalite nke Septemba 2024: Oge ịtụ vootu ngalaba otu izu abụọ
  • Ọktoba–Nọvemba 2024: Nyocha mmetụtara nke ndị ahọpụtara
  • Nzukọ otu Board na Disemba 2024: Ndị nlekọta ọhụrụ nọ nụ

Matakwuo maka usoro nhọpụta nke 2024 - gụnyere usoro iheomume zuru ezu, usoro nhọpụta, iwu mkpọsa, na ntuziaka ntozu ndị ntuliaka - na ibe Meta-wiki a, wee mee atụmatụ gị.

Ntuliaka ndị ọrụ afọ ofufo

Ụzọ ọzọ ị ga-esi tinye aka na usoro nhọpụta 2024 bụ ịbụ onye ọrụ afọ ofufo. Ndị ọrụ afọ ofufo bụ ihe nnọchianya n'etiti kọmitii ntuliaka na ngalaba otu ha. Ha na-enyere aka hụ na ndị obodo ha nọchitere anya ma kpọkọta ha ka ha mee ntuliaka. Mụtakwuo maka mmemme yana otu ị ga-esi sonyere na ibe Meta-wiki.

Ezi echiche,

Dariusz Jemielniak (Onye isi oche kọmitii ọchịchị, otu ndị na-arụ ọrụ nhọrọ bọọdụ)

[1] https://meta.wikimedia.org/wiki/Special:MyLanguage/Wikimedia_Foundation_elections/2021/Results#Elected

[2] https://foundation.wikimedia.org/wiki/Committee:Elections_Committee_Charter

[3] https://foundation.wikimedia.org/wiki/Minutes:2023-08-15#Governance_Committee

[4] https://meta.wikimedia.org/wiki/Wikimedia_Foundation_elections_committee/Roles

[5] Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị ndọrọ ndọrọ dị mma bụ iri na abụọ maka ohere oche, usoro ntinye aha ga-akpalite ma ọ bụrụ na e nwere ihe karịrị ntinye iri na ise ndị ​​na-apụta maka ntuliaka n'ihi na ndị otu ruo atọ na-ewepụ nwere ike iche na ọ bụ ndị a na-achụpụ achụpụ nakwa ọ ga-abụ nnukwu ọrụ maka nye Ndị mmekọ na-eme usoro ntinye aha iji kpochapụ naanị otu ruo mmadụ atọ na listi ndị a ga-ahọrọ.