Akwụkwọ ikike ngagharị/Otu na-edepụta Akwụkwọ ikike ngagharị

This page is a translated version of the page Movement Charter/Movement Charter Drafting Group and the translation is 100% complete.

Biko hụ Akwụkwọ ikike/Komiti Ndepụta/Ndepụta Usoro maka atụmatụ nke a ma hụ Akwụkwọ ikike/Komiti Ndepụta maka oku maka ndị aga-eme ntuli aka.


(Oghere maka ịhazi ọrụ ndị na-edepụta ihe; a ga edenye-jupụta ngwa ngwa o kwere omume)

Otu na edepụta akwụkwọ ikike ngaghari ga-abụ kọmitii nke ndị mmadụ n'mpaghara ngaharị ahụ iji kwado ịdepụta Akwụkwọ Ikike Ngaghari.

Enwere atụmatụ abụọ akọwapụtara (1 na 2) maka otu esi etinye nke a n'ọrụ. Ị nwere ike ịgụ atụmatụ ndị ọzọ na mkparịta ụka ndị gara aga.

Gịnị kpatara?

Anyị bụ ngalaba ngagharị na-eto eto, anyị kwesịrị itinye olu ọhụrụ na ụdị dị iche iche na usoro ime mkpebi. Anyị bu n'obi ịkwalite usoro maka ntụkwasị obi na nhazi n'etiti ndị o metụtara, mepụta nghọta zuru oke nke ihe na-akọwa ịbụ akụkụ nke ngagharị anyị, ma nwee usoro iji hụ na usoro na mgbanwe ndị na-emetụta Ngaghari anyị dum bụ ndị ziri ezi ma kwesi ntụkwasị obi. N'ozuzu, ọ bụ ihe dị mkpa inwe usoro dị n'otu iji kọwaa otu esi arụkọ ọrụ ọnụ yana otu a ga-esi nweta usoro ntụzịaka ka ọ bụrụ akụrụngwa dị mkpa nke gburugburu ebe obibi nke ihe ọmụma a ga enweta n'efu n'afọ 2030.

Ndabere: Gbaa mbọ hụ na ọ bụ nha nha n'ime mkpebi

Gịnị? =

Mepụta Akwụkwọ ikike ngagharị ka:

  • Debe ụkpụrụ, ụkpụrụ na ntọala amụma maka usoro ngagharị, gụnyere ọrụ na ibu ọrụ nke Kansụl zuru ụwa ọnụ, mpaghara na isiokwu ụlọ, yana ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị adị na ndị ọhụrụ na ndị na-eme mkpebi,
  • Tọọ ihe achọrọ na njirisi maka mkpebi na usoro dị na ngagharị ka ọ bụrụ nke ziri ezi ma kwesi ntụkwasị obi nke ndị niile ometụtara, dịka, maka:
    • Idobe gburugburu ebe mmekọrịta dị mma,
    • Ihụ maka ngaghara gbasara maka nweta ego na nkesa ya
    • Inye ntụzịaka nkịtị gbasara otu ekwesịrị isi kenye akụrụngwa site na usoro doro anya.
    • Ịkọwapụta otu obodo si arụkọ ọrụ ọnụ ma doo ibe ha anya.
    • Ịtọpụta atụmanya maka isonye na ikike ndị sonyere.

Oke =

Mepụta IGC zuru oke ma ọ bụ naanị kọmitii nhazi Akwụkwọ ikike?

  • Nkwekọrịta dị ugbu a bụ ilekwasị anya na ịdepụta akwụkwọ ikike . Mepụta kọmitii na-edepụta akwụkwọ ikike naanị maka oge a, ọ bụghị IGC zuru oke.

Komiti =

Kedu ụdị ndị otu achọrọ, oleekwa otu a ga-esi họrọ ha? Kọwaa ikike achọrọ, nka na ihe ọmụma (jụọ), nka, nka dị iche iche maka kọmitii ndepụta. ("Gịnị")

Usoro nhazi/nhọpụta ga-esochi.

ihe edepụtara a ga-atụle. Maka nka achọrọ, hụ nka na ahụmịhe

Usoro

Kedu ka kọmitii nwere ike isi rụọ ọrụ ma na-eme ihe n'ụzọ doro anya ma na-etinye aka na obodo?

a ga-atụle.

Nkwado

Kedu ka ndị obodo nwere ike isi nwee ọrụ bara uru na nnabata ikpeazụ nke MC? Kọwaa usoro nnabata nke siri ike ma na-etinye aka na obodo nke ọma. ("Olee otu")

Hụ Usoro nkwado

Nkọwa

MS
Usoro ngagharị
WG
Otu na-arụ ọrụ nke usoro atụmatụ ngaharị ahụ
MC
Akwụkwọ ikike ngaharị
IGC
Kansụl zuru ụwa ọnụ nwa oge
GC
Kansụl zuru ụwa ọnụ
WMF
Wikimedia Foundation
BOT
Ndị otu bọọdụ a tụkwasịrị obi