Akwụkwọ ikike mmegharị/Kọmiti Nhazi/ Usoro Nhazi

This page is a translated version of the page Movement Charter/Drafting Committee/Code of Conduct and the translation is 100% complete.


Atụmanya

A na-atụ anya ka ndị otu MCDC mee:

  • Rube isi nye Usoro akparamagwa zuru ụwa ọnụ;
  • Mezue ụkpụrụ nke Movement Charter Kọmitii na-ede pụta (MCDC);
  • Chekwaa na ntụkwasị obi kwesịrị ekwesị mkparịta ụka na ntụle nke Kọmitii ahụ. (Rịba ama: Kọmitii ahụ na-agbaso ụkpụrụ Chatham House gbasara mkparịta ụka na ntule.)
  • Tinye aka na ihe omume na mkparita ụka kọmitii

Zubere anoghị

  • Mgbe onye otu kweere na ha agaghị enwe ike isonye na ihe omume na mkparịta ụka nke Kọmitii mkpụrụ ụbọchị asaa ma ọ bụ karịa, ha kwesịrị ịgwa Kọmitii ahụ tupu oge eruo site na e-mail * wee chọpụta oge ha tụrụ anya na ọ gaghị anọ na MCDC / Usoro ezumike (akwụkwọ na-abụghị nke ọha)
  • Onye otu ahụ nwere ike inwe atụmatụ ya na enweghị atụmatụ na ọ gaghị anọ ya ruru ugboro atọ (3) n'ime ọnwa isii ọ bụla, ma na nchịkọba anọghị enweghị ike ịgafe mkpụrụ ụbọchị iri atọ n'ime oge ahụ.

Adighị arụ ọrụ

  • Enwere ike ịtụle onye otu dị ka onye anaghị arụ ọrụ mgbe:
    • Ha agaghị aga nzukọ Kọmitii atọ zuru oke n'usoro, na-agwaghị ndị otu Kọmitii ahụ tupu oge eruo site na email, ma ọ bụ ozugbo na ebumnuche nzukọ.
    • Ha anaghị azaghachi na nzikọrịta ozi ozugbo n'ime mkpụrụ ụbọchị iri atọ na-enweghị nkọwa.
    • Ha anaghị esonye na mkparịta ụka, nzuko ndị obere kọmitii ma ọ bụ inwe mmekọrịta n'ihe omume ihe karịrị ụbọchị iri atọ na-enweghị nkọwa.
  • Kọmiti nta ga-enyocha adịghị arụ ọrụ mgbe enwere mkpesa. Ndị otu na-eme mkpesa nwere ike ịnye ihe akaebe nke anaghị arụ ọrụ.

Mwepụ

  • A kọwapụtara mwepụ dị ka mmachibido iwu na-adịgide adịgide nke isonye n'ime Kọmitii ahụ.
  • Enwere ike wepu onye otu mgbe:
    • Ha anaghị echekwa na ntụkwasị obi kwesịrị ekwesị mkparịta ụka na ntụle nke Kọmitii ahụ
    • Ha gafere ụbọchị anọghị nke Kọmitii nyere.
    • Ndị Kọmitii kwuru na ha anaghị arụkwa ọrụ.
    • Ha na-eme nke ọ bụla n'ime omume ndị a na-anabataghị nke e depụtara na Usoro Omume Ụwa Nile, n'ime Kọmitii ma ọ bụ n'ime ọrụ ngo Wikimedia ọ bụla ma ọ bụ na ihe omume ndị Wikimedia kwadoro (nke emere na Ịntanet ma ọ bụ nke ọgbakọ mmadụ).
    • Ha na-emebi nkwekọrịta nzuzo nke metụtara Kọmitii
    • Ha anaghị ekwupụta esemokwu nke mmasị
  • Kọmitii ahụ nwere ike ịtụle nhọrọ mkpebi esemokwu na-enweghị ntaramahụhụ n'otu n'otu, dị ka ụzọ ọzọ maka mwepụ.

Mmejuputa

  • A ga-akpọ mmadụ atọ ndị sitere na kọmitii nta ahụ kwa ọnwa anọ. Kọmiti nta ahụ ga-ahụ maka ịnata na ịhazi mkpesa ọ bụla gbasara onye otu ahụ ọ bụla.
  • Aga na-atụgharị ndị otu MCDC niile na kọmitii obere ahụ. Enwere ike agaghị atụgharị ndị otu MCDC nile ugboro abụọ ma ọ bụ na ntụgharị

na-esote were ruo mgbe atụgharịchara ndị otua nile.

  • Ọ bụrụ na otu onye nke so na kọmiti dị ugbu sokwa na mkpesa enwere, onye otu MCDC ọzọ ga-anọchirịrị ya.
  • Ọbụ ọrụ Kọmiti nta ahụ ịnakọta ozi gbasara mkpesa ọ bụla ma wepụta okwu ahụ na nzuko izugbe MCDC.

Ntinye akwụkwọ na nyocha

  • A ga-emerịrị mkpesa site na ozi ịntanet wee ziga ya naanị na kọmitii obere. Ndị kọmiti obere ahụ ga-ekwuputa mkpesa ọ bụla na kọmitii ndum, mana kọmitii obere ga-ahụ maka ileba ya anya.
  • Ọ bụrụ na anabatara mkpesa ahụ, kọmitii obere ga-agwa onye ahụ site na ozi ịntanetị ihe gbasara usoro na-abịa, ọwa MCDC Telegram na (ebe ọdabara) ibe okwu onye ọrụ Meta Wiki.
  • Kọmiti ga-ekpebi ụbọchị ikpe ahụ. Ma ndị kọmitii obere ma ndị mkpesa metụtara ka-aga ahapụ ka ha nye mkpesa maka ntule na ileba anya.

Ntụli aka na ime iwu

  • Ọ bụrụ na ndị MCDC ekpebie ntụli aka ka emee mwepụ, a na-ahapụ onye ọ bụla so na MCDC ịtụ vootu mwepụ nye onye otu a. Ndị ọrụ nkwado kwesịrị ịhụ na-agbasara usoro ntụli aka na-amaghị aha onye tụrụ ya iji zeere mmegwara nwere ike ịdapụta.
  • Usoro mwepụ ahụ chọrọ ụzọ abụọ nime ụzọ atọ (ịchịkọta ọnụ) nke ndị otu Kọmitii tozuru oke iji kwadoo atụmatụ mwepụ tupu emebe ya. Ọ bụrụ na enwetaghi votu na-usoro nke mbụ agbasara, enwere ike imezi ya ma gosipụta ya na votu nke abụọ. Ọ bụrụkwa na-enwetaghị votu ahụ usoro nke a, a ga-atụfu ya, ọ dịghịkwa ihe ọzọ a ga-eme.
  • Ndị otu kọmiti tozuru etozu isonye mee ntụli aka ma ewezuga onye otu ahụ nke ọbụ ya ka ana-atụrụ votu ahụ. Ndị otu a nwere ike ịla azụ, mgbe nke a mere agaghị etinye ha na ndị nwere ike nkwado. Agaghị etinye ndị otu anaghị arụ ọrụ na ndị nwere ike nkwado ọ gwụla ma ha ana-agbasi mbọ ike isonye na votu ahụ.
  • Agaghị etinye akwụkwọ mkpesa na mkpebi ikpeazụ nke ndị MCDC.