This page is a translated version of the page Grants:MSIG/FAQ and the translation is 100% complete.

Ndị mmekọ ha pụrụ itinye akwụkwọ ọbụlagodi na ha na-enweta ego kwa afọ site na Wikimedia Community Fund?

Enwere ike ịkwụ ụgwọ nkwughachi maka ndị ọrụ afọ ofufo na-arụ ọrụ maka ọrụ ha?

  • Ee.

A pụrụ ịsụnye arịrịọ enyemaka maka atụmatụ nke otu ọzọ na-arụ ọrụ na ya?

  • ọ bụ ezie. Ọ bụrụhaala na enweghị njikọ n'etiti ọrụ ọhụrụ na nke na-aga n'ihu.

Anyị enweelari atụmatụ mmejuputa. Onyinye nkwado nke MSIG ọ nwere ike ịkwado nzọụkwụ ndị ọzọ?

Ee, Ọ pụrụ. MSIG nwere ike ịkwado atụmatụ mmejuputa niile. Biko kpọtụrụ ndị otu MSG ka ha hazie mkparịta ụka iji kwurịta nzọụkwụ ndị ọzọ.

A pụrụ itinye arịrịọ enyemaka n'asụsụ ala onye na-arịọ arịrịọ maka enyemaka?

  • Ee, n'ezie. A pụrụ itinye akwụkwọ n'asụsụ ala nke onye ma ọ bụ otu na-etinye akwụkwọ.

Kedụ otu Movement Strategy Implementation Grants si dị iche na ndị Grants ndị ọzọ?

  • Movement Strategy Implementation Na-enye onyinye ego maka ọrụ ụfọdụ gbapụtara ihe. Ọ adịghị ka onyinye ego nkwado ndị ọzọ nke nwere ike ịbawanye na nsonaazụ na mmepụta, nsonaazụ nke ọrụ MSIG ọ bụla ga-enwe mmetụta kpọmkwem na atụmatụ MS nkea lekwasịrị anya.

Movement Strategy Implementation Grants ọ na-akwado iwe onye ndụmọdụ ma ọ bụ ọkachamara ọzọ n'ọrụ?

  • Ee, Ọ bụ ezie. . Biko hụkwa na akọwapụtara ọrụ onye ndụmọdụ a (ma ọ bụ ọkachamara ọzọ) nke ọma. Nke a gụnyere oge a ga-atụ anya na ha ga-etinye na ọrụ a.

A pụrụ ikerịta atụmatụ / echiche ọrụ n' ebe ndị otu MSG nọ tupu asunye ya?

  • Ee, Ọ dị mma. Anyị na-anabata gị ka ị kesaa echiche gị banyere ọrụ n'ebe ndị otu MSG, maka nzaghachi, tupu ị ịsụnye ọchicho nke obi gị na meta. Nke a bụ ezi nzọụkwụ dị mma nke ukwuu .

Movement Strategy Implementation ọ na akwado n' ụzọ ego maka ọrụ ntụgharị n' asụsụ ọzọ?

  • Mbaa. Ọrụ ndị nwere ntụgharị dịka naanị ebumnuche ha agaghị anabata nkwado . Otú ọ dị, enwere ike ịkwado ntụgharị n' asụsụ ọzọ dịka akụkụ nke ọrụ Movement Strategy.