Training modules/dashboard/slides/10304-neutral-point-of-view/ig

This page is a translated version of the page Training modules/dashboard/slides/10304-neutral-point-of-view and the translation is 100% complete.

Pillar nke Abụọ

 
Foto nke Eryk Salvaggio

"'Wikipedia nwere echiche nke eleghị mmadụ anyan'ihu pụrụ iche. "'

Ederede Wikipedia kwesịrị idekọ ma kọwaa isi echiche n'ụzọ ziri ezi na nke na-adịghị ele mmadụ anya n'ihu. Naanị eziokwu! Ekwela:

  • Arụmụka ma ọ bụ mgbalịa ime ka ndị na-agụ ya kwenye
  • Kesaa ahụmịhe nke onwe ma ọ bụ echiche
  • Kesaa nyocha nke gị banyere ozi ị na-ahụ

N'ezie, ọ bụghị mgbe niile ka eziokwu na-edo anya. Ụfọdụ ederede nwere ike ịkọwa ọtụtụ echiche. N'ọnọdụ ndị dị otu a, gosipụta echiche ọ bụla n'ụzọ ziri ezi, na ihe gbara ya gburugburu. Atụghị aro na otu ụdị akụkọ ahụ bụ "eziokwu" ma ọ bụ "nke kachasị mma".

"'Nke a bụ nnukwu ihe. "'Ihe ọ bụla ị na-agbakwunye na isiokwu kwesịrị ịdabere na isi iyi nke ozi e bipụtara, ị ga-ekwukwa mgbe niile ozi ahụ mgbe ị gụnyere ya. (Echegbula onwe gị - anyị ga-egosi gị otú o si mee mgbe e mesịrị). Nke ahụ pụtara ịkọwapụta akwụkwọ ndị e bipụtara, ndị nwere ikike nke ndị mmadụ tụkwasịrị obi.