Movement Charter/Drafting Committee/Announcement - Short notice on key projects 2024-03-25/ig

N'oge na-adịghị anya, a ga-ekesa akwụkwọ zuru ezu nke Charter Njem Wikimedia

You can find this message translated into additional languages on Meta-wiki. Please help translate to your language

Ndewo,

Kọmitii n’ahụ maka idepụta akwụkwọ Movement Charter ji obi ụtọ na-akọwapụta na a ga-ebipụta akwụkwọ nkọwa zuru ezu nke Movement Charter n’ụbọchị abụo nke ọnwa Eprel , 2024. A ga-eji nke a wee malite oge ntinye aka ngalaba otu site n’ụbọchị abụọ nke ọnwa Eprel wee ruo n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Eprel.

Movement Charter bụ akwụkwọ a na-atụ aro iji kọwapụta ọrụ na ibu ọrụ dịịrị ndị otu na ngalaba niile nke Otu Wikimedia , gụnyere iwepụta ndị otu zuru ọnụ maka ịchiisi nke njem a.

A na-anabata onye ọ bụla nọ na Otu Wikimedia ka ọ kọwapụ echiche n’ibe akwụkwọ Charter zuru ezu - nke a bụ ohere ikpeazụ ịnye nzaghachi tupu emelite akwụkwọ Charter maka ntuliaka nkwado n’ọnwa Juun afọ 2024.

Otu i ga-esi nye nzaghachi gị?

Gụọ gbasara ozi Komitii a kachasị ọhụrụ maka ozi ndị ọzọ.

N'aha MCDC,